ENUGWU:EJIWORO EGO GBAPỤTA IGWE NDỊ NTỌ FULANI TỌRỌ

Spread the love

Enugwu: Ndi Ntọ ahapụwo Igwe Sunday Orji nke Obom-Agbogugu n’Okpuru Ọchịchị Ògwù n’Enugwu Steeti na nwunye ya Aliisi na mgbede taa bụ Wenezdee, abalị asaa nke ọnwa Ọgọọst.

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/04/ozo-emekwaa-nenugwundi-nchi-ehi-atorowo-igwe-na-lolo-ya/

 

Ndị Ntọ Fulani tọrọ ha na mgbede ụbọchị ụka n’ụzọ awara awara si Enugwu gaa Pọt Haakọt n’Ụmụọgba, Ihe ka ha si ụka ncheta ọmụmụ nne bishọọpụ ụka Katọliki na dayọsis Ògwù were na-alọta.

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara a kwụrụ ego mgbapụta tupu ahapụ Igwe a na nwunye ya.

Ndị Ntọ ahụ kwuburu Nde Naịra iri ise (N50m) ma mechaa butuzịa ya na Nde Naịra iri abụọ (N20m)

Ego mgbapụta a pụtara na ndị arụrụ ala a e nweela ọkpụrụkpụ ego iji zụta ngwa ọgụ were gaa n’ihu n’arụ ha na-akpa

Leave a Reply

Your email address will not be published.