ENUGWU:IDIDE DỊZỊ NA MMIRI PỌMPỤ

Spread the love

Enugwu: Na mmiri anaghị agba n’ọtụtụ ebe n’Enugwu abụghịzị akụkọ. Nke na-eme ugbua bụ na mmiri na-agba n’ebe ụfọdụ buzi idide.

Nkea a bụ n’agbanyeghị akatamkpo ego nile ọchịchị ndị gwaworo aga na steeti ahụ tufuworo maka mmiri ọgbụgba ọkacha Gọọmenti nke pụrụ ikpeazụ. 

Otu onye bi n’ Enugwu nọzị na Twitter were kọwaa udiri mmiri na-agbazị n’Enugwu, onye setere ya n’onyonyoo nke gosiri na idide dị n’ime ya.

Okwu ya;

Nke bụ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị n’Enugwu enweghị mmiri pọmpụ. Ihe m chọrọ igosi unu bụ udiri mmiri ndị ụlọ ọrụ mmiri, ndị Water Corporation na-enyezi anyị. Biko, gbaa mbọ hụ na gị n’ezinụlọ gị añụghị ya maka na ọ dịka anaghịzị emebe ya ọfụma

Leave a Reply

Your email address will not be published.