ENUGWU:ỤGBỌALA MMADỤ ANỌGHỊ EBUTELA ỌGBATA UHIE

Spread the love

Enugwu: Ihe dị egwu mere n’Obiagụ, Enugwu na mgbede ụnyahụ, Wenezdee, abalị asaa nke ọnwa Ọgọọst, oge ụgbọala madụ anọghị butere ọgbata uhie n’okporo ụzọ.

Ya bụ ụgbọala Toyota Camry gbapụrụ ọsọ gbafee ụzọ were makwasị n’elu gburugburu ụzọ (roundabout) nọ nso ebe ahụ.

Onye nta akụkọ hoo!haa!! nọ ebe ahụ chọpụtara na onye nwe ụgbọala ahụ dọsara ya n’akụkụ ụzọ were banye n’ụlọ ọrụ dị n’ihu ebe ahụ ịga me mkpa ya.

Site na nchọpụta o mere, o doro anya na onye nwe ụgbọala ahụ etinyeghi ya na “parking gear” tinyekwara na ebe ahụ dị na. mkpọda ugwu.

Nkea meziri na ụgbọala ahụ pụrụ na “gear” wee were ọsọ gbaghachiwa azụ tupu gburugburu ụzọ

Chineke zọrọ mmadụ bụ na o nweghị ụgbọala ma ọ bụkwanụ ndị mmadụ na-agafe okporo ụzọ oge ahụ.

Bikonu, ndị Ọkwọ ụgbọala gbaa mbọ na-etinye ụgbọala ha na “parking gear” iji gbochie ihe mberede.

Leave a Reply

Your email address will not be published.