IMEGIDE NTỌ NDỊ FULANI:NDỊ DINTA DỊ MKPA – CHIMA OBIEZE

Spread the love

Enugwu: Onye na-anọchite anya mpaghara Ezeagụ n’Ụlo Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti, Rt Hon. Chima Obieze ekwuola na ndị dinta dịkwa mkpa n’agha Gọọmenti na-ebu megide ndị ntọ ndị Fulani n’ihi na o nweghị ndị ka ha mara ala.

Obieze kwuru nkea taa bụ Tọọzdee, abalị asaa nke ọnwa Ọgọọst n’okwu o welitere n’ihu Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti banyere oke mkpa ọ dị iwelite ọnọdụ nchekwa n’ime obodo nakwa ụzọ awara awara nile dị n’ Enugwu Steeti.

Nwamadị a bụkwa onye ọka iwu kpọkwara oku ka Ụlọ Nzukọ ahụ katọọ ajọ ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na steeti ahụ ma kelekwaa Gọvanọ Steeti ahụ bụ Rt. Hon. Ifeanyịchukwu Ugwuanyị maka mbọ nile ọ na-agba banyere nsogbu ahụ.

Ọ kọwara na  nsogbu ndị ntọ ndị nchị ehi anaghịzi ekwe ka ndị ọrụ ugbo gaa ụgbọ.

“Kaọdịtaa, ndị  be anyị bi n’ime obodo anaghịkwa aga ugbo maka ndị nchị ehi a nke mere na agụụ karịzịrị n’obodo.

Gụkwuo:

O kwukwara na nso nso a, na e gburu ụkọchukwu ndị Katọliki, Fada Pọl Ofu ma tọrọkwa Igwe Sọnde Ọjị nke Obom-Agbogugu na nwunye ya.

Obieze sịkwa na-ekwesịrị ime ka ndị steeti ahụ nile dị nkwadebe ichekwa onwe ha, n’obodo n’obodo, n’ogbe n’ogbe.

Oku ahụ ọ kpọrọ gụnyere ikele Gọvanọ maka iweta atụmatụ iwu imegide Ntọrị bụ Anti-kidnapping executive Bill tinyere iwe ndị nche ọhịa n’ọrụ nke na-aga n’ihu ugbua.

Ọzọkwa bụ ka Mịnịstrị na-ahụ maka Mmepe Ime Obodo, ndị okpuru Ọchịchị nile nakwa ndị ọzọ bụ ndịsonwere(stakeholders), n’iji mezu ntụziaka Gọvanọ na ha gbaa mbọ hụ na ndị nche igbe bụ ndị aghazigharịrị ma nyekwa ha ngwa ọrụ nile kwesịrị ekwesị.

Ndị kwadoro oku ahụ ọ kpọrọ gụnyere; Hon. Jane Eneh, Rt. Hon. Iloabuchi Aniagu, Rt. Hon. Chinedu Nwamba nakwa Hon. Okwu Chinedu

2 Comments

  1. Okwu onye nnochite kwuru bu ihe mere eme kama ekwesighi ikwuputa udi ihea niru ohaneze. O ka nma nezoro alo dinma otu ezo. Maka ndi ilo nwere Ike buso ha agha. Di ocho anaghi ekwucha ihe ohuru nelu nkwu. Daalu nu ibe anyi.




    0



    0
  2. Ndewo Onye Nnochite Okay nKe a amagbula onwe ya. Ndi be anyi si name ngwucha abughi ujo. Anyi ga ejisike gburugburu anyi n’ihi na onye chukwu na-eche na echekwa onwe ya. Ndewo




    0



    0

Leave a Reply to Anonymous Cancel reply

Your email address will not be published.