KA CHI FOO:DSS ENWETALA IKIKE ỊKPỌCHIKWU SOWORE

Spread the love

Abụja: Ụlọikpe Etiti nọ n’Abụja  enyela ụlọ ọrụ nchekwa DSS ikike ịkpọchikwu onye mkpokọta otu #RevolutionNow, Omoyele Sowore abalị iri anọ n’ise ọzọ ruo oge ha jiri mechaa nnyocha ha Gụkwuo: http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/03/ime-ngaghari-iweakpurula-sowore/

Ọkaikpe Taiwo Taiwo, na mkpebi ya n’ụtụtụ taa bụ Tọọzdee nyere ndị DSS ikike ijide  Sowore ruo abalị iri anọ n’ise na mbido, nke e nwere ike ịgbatịkwu ma ha tinyekwa akwụkwọ, iji hụ na ha mechara nnyocha ha. 

Ndị DSS wetakwara efere nchekwa ozi DVD abụọ nke ihe nọ n’ime ha bụ ọgbakọ Sowore na Mazị Nnamdi Kanụ, Onyeisi amachiri amachi bụ Indigenous People of Biafra – IPOB) nakwa ajụjụ ọnụ a gbara Sowore, ebe ọ nọrọ zọọ mba na ndị otu ọzọaa na chịkwara amachi bụ Islamic Movement of Nigeria (IMN) ga-enyere ya aka ịkwatu ọchịchị e nwere na Naịjiriya ugbua.

Leave a Reply

Your email address will not be published.