AKWỤLA KA ỤMỤ NWANYỊ ANAMBARA NỌ MALESHIYA NA-AGBAZỊ-ASWAM

Spread the love

Ọka: Otu jikọtara ndị Anambara Steeti bi na mba Maleshiya ụbọchị Tọọzdee, abalị asatọ nke ọnwa Ọgọọst were tikuo ọhaneze banyere etu ụmụ nwanyị ha bi na mba ahụ si werezịa ịgba akwụla mere aka ọrụ.

Ha kwuru nkea oge ha gwara ndị nta akụkọ okwu n’Ọka bụ isi obodo Anambara Steeti.

Mazị Okwunwanne Mmaduka, Onyeisi otu Anambra State Welfare Association Malaysia(ASWAM), kwuru na ajọ ọnọdụ ahụ na “echu ha ụra” 

N’ihi ya, ọ sịrị na ha na-akwado ịga kpọtụrụ ndịsonwere Steeti ahụ maka ilebanye anya n’ okwu ahụ

O kwuru sị, “Anyị ga-aga hụ Igwe Nnaemeka Achebe, Obi Ọnịcha na ndị Igwe ndị ọzọ, Gọvanọ Willie Obiano tinyekwara ndị ọzọ bụ ndịsonwere Steeti a iji mara ihe a ga-eme”

Ọ sị na otu ahụ na enweta ihe karịrị mkpesa iri abụọ kwa izu ụka maka ụmụ nwanyị Anambara nọ ọrụ akwụla na Maleshiya, tinyekwara na ụfọdụ na-atufu ndụ ha na ya.

“Anyị agbapụtawo ma kpọlata ọtụtụ n’ime ha Naịjiriya, ebe anyị tinyere ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ na Maleshiya. Ihe a na-enyezi anyị ajọ aha”

“ASWAM gbarụrụ ihu maka ọtụtụ ụmụ nwanyị n’ụmụ agbọghọ Anambara Steeti nọ Maleshiya si adabanye n’ịgba akwụla nakwa ịbụ ndị agbara na mgbere maka ọrụ akwụla.

Bikonu, ọ mụrụ awọ bee ya ọdụ, ọ mụrụ nkakwụ pịa ya ọnụ

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.