CHAI! LEENU “IGBOTIC ROMANCE”

Spread the love

Bikonu, onye sị na Igbo amaghị eme “Romance”? Onye sị na ọ bụ ndị ọcha kuziri anyị etu e si eme ịhụnanya dị n’etiti nwoke na nwanyị a na-eto akpịrị?

Leenụ “Igbotic Romance”. Ndị okongwu lechaa udi a, ọ dị ha ka megharịa Ịgba Nkwụ ọzọ.

Nwa-afọ Igbo a bụ Mazị Azụbụike Ọbasị,  onye ga-agba nkwụ nwanyị n’abali iri abụo na abụo nke ọnwa Ọgọọst, ewerela ụzọ pụrụ iche were bie akwụkwọ akpọmoku (invitation card) maka “Ibu Maị” Ọdịyan’obi bụ Chidịmma.

Ha kere ekike Ndigbo kpọmkwem. Ọzọkwa, onyonyoo ha segasịrị gosiri ejirimara Ndigbo;ma ọrụ ugbo ma ịkpa nkụ, wdg. 

Ya bu foto ha mara mma pụrụ iche nke mere ọtụtụ ndị ji na àjà ha mma.

Nwa amadi a egosiputawo na Igbo ga-adi, omenala Igbo ga-adi, Igbo Amaka, hoo!haa!!

hoo!haa!! na-enyezi ndị ntorobịa ndị ọzọ ndụmọdụ ka ha ṅomie Azụbụike na Chidịmma site na inwe mmasị n’ome ala Igbo. Onye ọbụla kewe ekike Ndigbo, riwe nri Ndigbo. Nke kacha mkpa bụ ịsụkwa asụsụ Igbo.

N’ihi nkea, Azụbụike na Chidịmma bụ ỌKA IBE hoo!haa!! maka izụ ụka na-ebido echi. hoo!haa!! ga – anọkwa Ogwuma Edda n’abalị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa maka Ibu Maị ha

Leave a Reply

Your email address will not be published.