ỌKA:MMỌNWỤ NỌZỊ NGAGHARỊ IWE

Spread the love

Ọka: Mmọnwụ ole mole ji ụzọ ụtụtụ Fraịdee pụta ime ngagharị iwe n’Obi Gọọmenti Anambara Steeti, Ọka.

Mmọnwụ ndị a ruru atọ n’ọnụ ọgụgụ nakwa ìgwè mmadụ so ha si Ụmụnya dị n’Okpuru Ọchịchị Oyi were bịa. 

Iwe ha bụ maka okwu ala ha nwere na be ha. Ha kọwara na ụmụ nwoke anọ egobiwo ndị akpụ obi ruru ihe dịka otu narị n’ọnụ ọgụgụ ibuso ndị be ha na-akwadoghị mgbere ala ha na-agba n’Odumodu, Ụmụnya agha.

Kaọdịtaa,ọtụtụ ndị obodo ahụ gbazịrị ọsọ ndụ maka ndị mwakpo a, ndị na-emekpa ha ahụ.

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2018/08/15/aka-akparala-mmadu-asaa-na-ala-utu-nuzo-ezighi-ezi-na-steeti-anambara/

Odeakwụkwọ obodo nta Odumodu Ana, Mazị Okwudili Ekene Okonkwo, kwuru sị: “Anyị nọ n’Obi Gọọmenti, Ọka ikwuputa mkpesa anyị megide mmadụ anọ ndị weghara na na-erekwa ala obodo.”

N’okwu nke ya, otu onye okenye obodo ahụ, Ichie Wilson Obinna, kwukwara sị: “Nsogbu a bidoro kemgbe afọ 2012, eze ọdịnala anyị bụ Igwe Kris Onyekwuluje, gbara mbọ idozi okwu a mana ndị a jụrụ ajụ”

Na nzaghachi ya, Onye Ndụmọdụ Gọvanọ n’okwu nchekwa, Mazị Chikodi Anara, toro ha etu ha ghara iso ụzọ tigbuo zogbuo were, sowe okwu ahụ.

Ọ dọwara aka na ntị na Gọọmenti agaghị eji nwayọ were soo onye ọbụla ga-ebute ọgbaghara n’obodo ahụ

Leave a Reply

Your email address will not be published.