JỌS:NDỊ FULANI ABAGHARỊALA OBODO NDỊ BIROM GBARA ỌSỌ NDỤ AHA

Spread the love

… N’agbanyeghị na Gọvanọ Lalong kwadoro Ruga

Jọs: Ndi Fulani abagharịala ụfọdụ obodo ndị Birom ebe ndị mmadụ gbara ọsọ ndụ aha.

Nkea bụkwa n’agbanyeghị na Gọvanọ Plaatu Steeti bụ Saịmọn Lalong na-akwado Ruga nakwa ihe ọbụla ndị Fulani chọrọ, iji mee ka obi dị ha mma.

Ka egwu, ka egwu “ụka abụrụwo na-ezi”. O teela e ji ekwu na ebumnobi ndị Fulani bụ iweghara ala ndị nwe obodo n’aka ike. Ọtụtụ were ya ka egwu. Ugbu a, kpọrọ kpọtọ agbaala n’ihu ehi.

Kemgbe ihe ruru afọ iri, ndị Fulani jiri nwayọ na-ebuso ndị nwe obodo na Plaatu Steeti agha. Ha na-egbu ma na-achụsịsị ha n’ala nna ha. Otu ihe ahụ ka ha na-emekwa na Benuwe.

Ruo taa, ndị Fulani n’ehi ha bichiziri n’Agatu, Benuwe Steeti kemgbe ndị nwe ala gbara ọsọ ndụ, ihe karịrị afọ abụọ gara aga.

Aka chịburu Plaatu Steeti bụ Jona Jang, onye bụkwa onye Birom; onye nnọchiteanya mpaghara Riyom/Barkin Ladi n’ụlọ nzukọ Omebeiwu ala anyị, Istifanus Gyang; Eze ọdịnala ndị Birom Gbong Gwom Jos, Da Jacob Buba; tinyekwara agbụrụ ndị ọzọ nọ n’Okpuru Ọchịchị Bassa soro rịọ Gọọmenti Etiti ka o tinye ọnụ n’okwu ndị nchị ehi si mba ọzọ iweghara ala ha mana “otu abụghị na-ezi”

Kaọdịtaa, obodo nta iri ise n’anọ ka ndị mwakpo a weghara woro, ebe ha baghariworo ọtụtụ obodo ndị ahụ aha.

Gụkwuo: http://www.hoohaa.com.ng/2019/07/28/tarabandi-nchi-ehi-ewegharala-mpaghara-kona

Obodo ndị Fulani wegharaworo gụnyere Rotchun , Dankum (abagharịrị “Mahanga”), Hywa (  (abagharịrị ”Lugere”), Fass (abagharịrị “Tafawa”), Davwak, Chwelnyap, Lyoho Dakar nakwa Angwan Dalyop ndị awakporo site n’abalị asaa ruo n’abalị iri nke one Septemba, afọ 2001 machufukwaa ndị nwe ala.

Ebe ndị ọzọ gụnyere “Janda, a wakporo n’abalị asatọ nke ọnwa Febrụwarị February, afọ 2010; Darin,  a wakporo n’abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Eprel, 2013, Shong I, Shong II; Rakweng; Dashugu; Diyan-Hei; Maseh (abagharịrị “Lugel”)  a wakporo ha nile n’abalị iri abụọ n’itolu nke ọnwa Juun, afọ 2012.

N’ịgbarụ ihu maka ya bụ mwakpo, otu ndị ntorobịa a kpọrọ, APC Youths Online Forum arịọwo ndị nile bụ ndịsonwere ka ha nyere  Gọvanọ Saịmọn Lalong aka iji “gbapụta obodo ndị ahụ nakwa ala ndị ahụ ndị nchị ehi weghara ma meghachikwa ha ndị nwe ha”

Hmm, ụmụ Igbo, onye Chukwu na-azọ, na-azọ onwe ya. Nkwụcha abụghị ụjọ, ka anyị keenụ nkwụcha maka na “ọ dachaara ji ọ dawara ede”. Taa bụkwa gboo!

Leave a Reply

Your email address will not be published.