2023:CHIDỌKA NA SANUSI NỌ ỌGBAKỌ UGBUA

Spread the love

Kano: Ichie Osita Chidọka (Ike Obosi) onye so na ndịsonwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) awuchiela n’obi Kano, Emir Sanusi Lamido Sanusi n’ehihie taa bụ Mọnde, abalị iri n’abụọ nke ọnwa Ọgọọst.

Chidọka, onye jiburu ọkwa dịka Mịnịsta na-ahụ maka Njem Ụgbọelu nakwa Onye Nlekọta ukwu otu Nchekwa Okporo Ụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC) site n’ozi hoo!haa!! nwetara bịara ịhụ Sanusi maka ụbụbọ dị oke mkpa.

Kepu Kepu hoo!haa!! na-anụ bụ na isi sekpụ ntị n’ụka ha ga-akpa bụ banyere Alahaji Atiku Abụbaka, onye jiri aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were zọọ ọkwa onyeisiala gbara n’Ụlọikpe.

Ha ga-akpakwa maka nhọpụta Onyeisiala afọ 2023 Chidọka so na ndi Igbo a na-atụ anya nwere ike ịpụta soro zọọ ya bụ ọkwa. 

Ndị ọchịchị abụọ a ka a tụrụ anya na ha ga-elebanyekwa anya n’okwu banyere Nhazighari Atụmatụ Ọchịchị ala anyị (Restructuring)

Nkea bụ otu ihe mmadụ abụọ a kenyere na ya nke ukwuu

Leave a Reply

Your email address will not be published.