E BUGHI M AMỤMA ỌBỤLA MAKA BUHARỊ – MBAKA

Spread the love

Enugwu: Ụkọchukwu Katọliki okwu ya na-ada ụda ma bụrụkwa onye nlekọta ọgbakọ ekpere Adoration Ministry Enugu, Fada Ejike Mbaka agọpụwo aka ya n’ụkwụ ya n’akụkọ na-efegharị n’ikuku na o buru amụma na njinji ga-eji n’Asọ Rọk n’abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba.

N’ozi o zigara ndị nta akụkọ, Mbaka kwuru sị:”Biko, ụmụ Chineke ibe m, nyerenụ m aka ịgwa ụwa na, mụnwa bụ  Fada Mbaka Ejike Camillus enweghị oge m jiri buo amụma maka abalị mbụ nke Ọktoba.

“Ozi ahụ esighị m n’aka. E nweghị oge ọbụla m ji nọrọ ebe ọbụla gwa onye ọbụla na m ga-agba alụkwaghịm n’ọrụ ụkọchukwu n’abalị mbụ nke ọnwa ọktoba.

“Nkea bụ aka ọrụ ndị iro m, ndị ekwensu ji mere ngwa ọrụ
“Ọgbakọ ekpere Adoration anaghị adị ụbọchị Tọọzdee ka ha si akọ, o nweghị mgbe m ji gwa onye ọbụla na oke mmiri ga-eso n’Asọ Rọk na Chineke na-ewere Onyeisiala Buhari iwe.

“Ozi a na-ewu ebe nile bụ arụrụ ala si n’aka ndị na-agara ekwensu ozi, iji mebi aha m. O nweghị oge m buru amụma ọbụla maka abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba ma ọ bụ megide Onyeisiala. Gịnị mere ndị mmadụ ji e butere onwe ha abụm ọnụ nakwa iwe Chineke”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.