ONYEISI PEACE MASS ENYEGHACHIWO ỤLỌAKỤ ỌKPỤRỤKPỤ EGO($7M) AKWỤFERE YA

Spread the love

… ọ bụ akparamagwa e ji mara Igbo bụ Igbo, Igbo mgbe gboo

Enugwu: Onye nwe ụlọ ọrụ ụgbọala Peace Mass Transit, Dọkịnta Madụka Onyishi emeela ihe eji mara Igbo bụ Igbo, Igbo mgbe gboo site na iweghachiri ụlọakụ First Bank of Nigeria Ijeri Naịra abụọ n’ụma abụọ (N2. 2bn)ha kwụnyere n’ọ́dọ́ ego (account) ya n’amaghị ama.

Ọ bụ Mazị Kokelụ Ben, onye nlekọta azụmahịa (Business Manager, Commercial Banking), First Bank nakwa Oriakụ Ifeọma Eleanya, onye nlekọta ụlọakụ Unity Bank, Ngalaba Enugwu, bụ ndị natara akwụkwọ ego(cheque) ahụ.

Dọkịnta Onyishi,onye kọwara ka o si chọpụta ego gbara ọkpụrụkpụ n’ọ́dọ́ ego ụlọakụ First Bank ya, sịrị na ya nara Nde Dọla atọ ($3m) n’aka Ụlọakụ Etiti Naịjiriya (Central Bank of Nigeria),  site n’aka Unity Bank PLC, mana a kwụzịrị ya Nde Dọla iri ($10m) ”

N’ozi ya, o kwuru sị, “Ego ole ha kwụnyere m bụ N3,219,500,000, mana ihe bụ ego m n’ime ya bụ N1,000,000,000; ya bụ na nke fọdụrụ abụghị ego m.

“E kwuru na agaghị etinye ego a n’ahịa m, were ego onye ọzọ na-erite uru. A gaghị m edebe Nde Dọla asaa abụghị nke m.

Gụkwuo:https://www.hoohaa.com.ng/2019/08/09/akwula-ka-umu-nwanyi-anambara-no-maleshiya-na-agbazi-aswam/

Onyeisi ụlọọrụ PMT ahụ sịrị na iwe were ya oge ndị ụlọakụ jụrụ ikweta na ha kwụfere ya ego ruru Nde Dọla asaa.

O kwuru na o mechara naa ha akwụkwọ ọnọdụ ọ́dọ́ ego (statement of account) ya iji mata ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgọrọ mana ha nọ na-egbu ya oge.

“Ka m jụwara ase, ha sịrị m chere oge ndị ụlọakụ ga-eme nghazigharị ọnọdụ ego ha iji chọpụta ma ọ bụ First Bank, Central Bank ka ọ bụ Unity Bank bụ ihe gbajọrọ ya.

Onyishi sịrị na ka ya chere otu ọnwa na anụghị ihe ọbụla, na ọ bụ ya meziri o ji kpọọ  ndi First Bank na Unity Bank tinyekwara ndị nta akụkọ.

Ọ sịkwa na ya zigara ụlọakụ ndị ahụ ozi imeelu mana o nweghị ihe ha chọpụtara.

Na nzaghachi ya, Mazi Kokelụ nke First Bank, Kokelu Ben, kọwara Dọkịnta Onyishi dịka onye na-akwụwa aka ya ọtọ.

hoo!haa!! na-ekwu sị, “Ndị ntorobịa Igbo ndị na-ebu ntụ, ndị na-agba akwụla nakwa ndị na-eme mpụ dị iche iche iji bute ego mbute, ha gbaa mbọ ṅomie udiri mmadụ a”

Leave a Reply

Your email address will not be published.