HAPỤ EKPERE,GAA RỊỌ NDIGBO BIKO MAKA ARỤ Ị KPASARA HA-FFK GWARA GỌWỌN

Spread the love

… Ọbara ndị Igbo i gburu na  Bịafra agaghị ekwe gị nwee ezumike

ICHIE Femi Fani-Kayode (FFK), onye bụbu Mịnịsta n’oge gara aga ma bụrụkwa okwu-atụ-egwu ekwuola na ekpere onye chịburu Naịjiriya n’ọchịchị ndị soja bụ Ọchịagha Yakubu Gowon na-achikọba lara n’iyi ma ọ bụrụ na ọ rịọghị Ndigbo mgbaghara maka arụ mkpochapụ mba a kpasara ha n’oge agha Bịafra.

FFK, n’ozi o wepụtara ụbọchị Mọnde, ụnyahụ sịrị na soja ndị Igbo dị Narị atọ tinyekwara Onyeisiala ka ndị soja ndị Ugwu gbunyụrụ anya n’abalị iri abụọ n’itolu nke ọnwa Julayị, afọ 1966; ebe ndị Igbo, ndị nkịtị a bọkara abọka site n’ọnwa Septemba ruo ọnwa Disemba afọ 1966, na mwakpo nkwafu ọbara dị ụzọ atọ n’Ugwu Awụsa ruru puku iri atọ (ụfọdụ ndị ọkachamara n’agụgụ ala(historians)) si n’ọnụ ọgụgụ ha ruru otu narị puku.

“Na mmechi, ndị Igbo ndị nkịtị enweghị ihe ha mere dị nde atọ n’ọnụ ọgụgụ, tinyere ụmụaka dị otu nde, ka ndị soja Naịjiriya nakwa ndị arụrụ ala ndị “Gwodo-Gwodo” kwafuru  ọbara ha site n’afọ 1967 ruo 1970,”

Fani-Kayode sị na ọ bụrụ na Naịjiriya chọrọ ka ihe dịkwara ha mma ọzọ, na ha kwesịrị ịchọ ihu Chineke ma rịọ Oseburụwa mgbaghara maka ihe nile ha mere nakwa nke ha ka na-emekwa Ndigbo.

“Ọchịagha Yakubu Gọwọn nwere ike chịkọba ekpere etu ọ sọrọ ya n’isi Naịjiriya mana ọ bụrụ na o kwetaghi na mkpochapụ mba nke Ndigbo gabigara n’ọchịchị ya site n’afọ 1966 ruo 1970 adịghị mma, ganye na ọ rịọ Ndigbo ka ha gbaghara Naịjiriya maka ihe anyị mere ha, ihe ka ga-akawanye njọ.

Onye nwere ntị ya nụrụ. Ugbua, ndị be ha, ndị Obinetiti ahụwala ihe Igbo hụrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.