LỌNDỌN:NYE ANYỊ IKPE NKWỤMỌTỌ-DI NA NWUNYE NDỊ NAỊJIRIYA E GBURU ỤMỤ HA ATỌ

Spread the love

Lọndọn: Mazị Jọn n’Oriakụ Linda Burke-Monerville, ndị Naịjiriya bi Lọndọn na-achọ ikpe nkwụmọtọ ka ụmụ nwoke atọ nwụlahachara ha n’obodo ahụ n’ọnwụ n’ime ọgụ afọ abụọ.

Di na nwunye a nọrọ oge ha bụ ndị ọbịa na mmemme TV “Good morning Britain” were kọwaa ihe ha gabigara kpatara na ha kpọlara ụmụ ha ndị fọrọnụ Naịjiriya, iji belata ha onwe ha ịbụ ndị a ga-ejikwa mma sụgbuo.

Na mmemme TV ahụ, Oriakụ Burke-Monerville jiri anya mmiri rịọ ikpe nkwụmọtọ maka ụmụ ya ndị nwoke atọ;Trevọ, 26, Josefụ, 19 na Devid, 38, bụ ndị e gburu n’ike n’ụzọ mwakpo atọ.

Devid Burke-Monerville ka a sụgburu na Juun afọ a na mpaghara Barnet.

Akwụkwọ akụkọ Sun UK kwukwara na nwanne ya bụ Josefụ Burke-Monerville, onye dị afọ iri n’itolu ka a gbagburu n’amaghị ama afọ isii gara aga mana ruo taa, o nwebeghi onye a mara ikpe maka ọnwụ ya.

Trevọ Burke-Monerville, nke di ọkpara dị afọ iri abụọ n’isii oge a sụgburu ya n’afọ 1994. Rụkwara taa, ọ nweghịkwa onye a mara ikpe maka ọnwụ ya.

Nne na nna a obi gbawaworo jizi anya mmiri kọsara ụwa etu ha siri gbasie mbọ ike ichekwa ezinụlọ ha site na ịkpọlazị ụmụ ha Naịjiriya.

Kaosiladi, ọnwa isii Josefụ n’ejima ya bụ Jọnatan ka sị Naịjiriya lọghachi ka a gburu ya.

Mazị Burke-Monerville kwuru sị, “Ụmụ ejima nke abụọ – E chetara m otu ụbọchị ha si akwụkwọ lọta were na-akọ ka na mmadụ siri na-alụ ọgụ n’ụlọ akwụkwọ, nwata akwụkwọ ọzọ mịpụta mma opio nye otu n’ime ha ka jiri lụọ ọgụ.

“Ozigbo ha kọrọ anyị akụkọ a, anyị kpebiri ịkpọlakwu ha”

Ka nwunye ya nọzị na-ebe akwa, Jọn kwuru sị, “E jisiziri m ndị fọrọ afọ n’ezinụlọ m ike”

Linda Burke-Monervilles kwukwara , “O nweghị onye nne kwesịrị ịgabiga udiri ihe anya mmiri a.

“A chọrọ m sọọsọ ikpe nkwụmọtọ. Na nke Josefụ, ndị uwe ojii kwechara nkwa nile ha kwere, na e jidela ụmụaka mere ihe a, ma mechaa, ha mewaa anyị obi.

Ihe na-arịzị ibe ya elu ugbua na mba Briteenụ bụ iji mma opio sụgbuo mmadụ.

Hmm, Bikonu, Lọndọn abụzị Ajegunle, Legọs ka ọ bụ Ámá Awụsa, Enugwu ka ọ bụzi Okpoko, Ọnịcha. Ọ kwa maka na ndị a bụ ndị isii ojii mere ndị Uwe ojii mba Briteenụ achọghịzị ịrụ ọrụ ha?

Leave a Reply

Your email address will not be published.