NTỌRỊ:UGWUANYỊ ETIELA IWU KA ETIKPỌỌ ỌGBA MA SỤKWAA OKE ỌHỊA N’Ọ̀GWỤ̀

Spread the love

Enugwu: Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyị nke Enugwu  Steeti nọrọ ụnyahụ bụ Mọnde tie iwu ka e tikpọọ ọgba ndị dịgasị n’Agbogwugwu, Isu Awaa nakwa Agbụdụ iji kwalite ọrụ nchekwa n’akụkụ ebe ndị ahụ.

Ugwuanyị nyere ntuzi aka a oge ọ gara leta ọnụ okpuru ala (tunnel) n’Ụmụọgba-Ihe dị n’Okpuru Ọchịchị Ọ̀gwụ̀ nke nọ n’ogologo ụzọ awara awara Enugwu – Pọt Haakọt, ebe ndị ntọ na-ezo ma sikwa na-agbalaga.

Ugwuanyị oke ọhịa dị n’Ihe-Agbogwugwu-Ọgbakụ-Amụri nakwa nke dị n’Isu-Awaa-Agbudu n’ime otu okpuru ọchịchị ahụ, ma tikwaa iwu ka e tikpọọ ọgba ndị dị n’Agbogwugwu nakwa ndị dị n’Isu-Awaa-Agbudu.

Gọvanọ ahụ letakwara ka ọrụ si aga n’ebe a na-arụ ụsụụ nta ndị agha (military base) n’ụmụ ọgba, n’ogologo ụzọ awara awara Enugwu – Pọt Haakọt ma nyekwa ntuzi aka ka asụchasịa ọhịa nile dị n’ebe ahụ ozigbo.

Onye dugharịrị Gọvanọ  Ugwuanyị n’ebe ndị ahụ bụ Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ògwụ̀, Hon. Stanli Okeke, ndị nnọchiteanya mpaghara Mgbago Ugwu Ògwụ̀ na mpaghara Ndịda (Ágbọ́) Ọ̀gwụ̀ n’ụlọ nzukọ omebeiwu Enugwu Steeti, Hon. Oriakụ Jen Ene na Hon. Jọnsịn Chukwuọbasị, nakwa ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu n’okpuru ọchịchị ahụ.

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/08/imegide-nto-ndi-fulanindi-dinta-di-mkpa-chima-obieze/

Ugwuanyị kwukwara na a ga-enwe ngagharị ndị ọrụ nchekwa dị iche iche n’ebe ahụ nile iji kwalite nchekwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.