ỌKỤ AGBAGBUOLA NWOKE JI NWANYỊ N’ELU ENYI YA NWANYỊ

Spread the love

Pọt Haakọt:  Njinji jiri n’ụbọchị Tọọzdee, abalị iri nke ọnwa Ọgọọst mgbe ọkụ gbagburu otu nwoke ji nwanyị ka ya n’enyi ya nwanyị na-ekpori ndụ n’Oginigba dị mpaghara Transamadi na Pọt Haakọt, Rivas Steeti.

Nwoke ahụ bụ onye ọrụ ụgbọ mmiri hapụrụ be ya bịa nke enyi ya nwanyị ka ha kwaratụ iko mgbe ọkụ ọgbụgba dapụtara.

Ọkụ ahụ gbagburu ha abụọ tupu etinyụchaa ọkụ ahụ.

Ozi anyị nwetere bụ na nwunye nwoke a amatabeghị ihe mere “di ya ọma”, onye o che na ọ ka nọ ọrụ.

Nwanyị ibe m chere na di ya ọma ka nọ ọrụ n’elu osimiri, ọ maghị na nwoke sizi n’elu nwanyị ọzọ laa mụọ.

Ụmụ nwoke lụrụ nwanyị kpacharanụ anya unu maka na ihe a fatara n’eze anaghị eju afọ. Ọzọkwa, onye aghụghọ na-aghọ, ihe ya a na-efu.

N’aka nke ọzọ, ụmụ nwanyị, unu awọzịla di unu njọ ihe unu ka ọ ga-abụ ha richaa unu ma pụwakwa ezi, nkata ekpudozịa onye aghụghọ.

 

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.