ONYEISI NDỊ NTỌ ZỤNYERE KAPTIN SỊ SỊ GBAGBUO NDỊ UWE OJII ỤGBỌALA

Spread the love

Jalingo: Aka akparala onye Kaptin ndị agha Naịjiriya ahụ nyere ndị ọrụ ya iwu igbagbu ndị Uwe ojii atọ ma tọghapụkwa onyeisi ndị ntọ bụ Alahaji Hamisu Wadume na Taraba.

Ozi hoo!haa!! nwetara na – egosi na ya bụ onyeisi ndị ntọ bụ onye Ome ọgọ zụnyere Kaptin ahụ ụgbọala dara oke ọnụ.

Oge ndị Uwe ojii ahụ kpụụrụ Wadume, ndị otu ya kpọrọ Kaptin ahụ, a kpọghi aha ya, so na ndị onye omekome ahụ na-akwụ ụgwọ kwa ọnwa.

Kaptin ahụ nyezịrị ndị soja ya iwu ka ha chụwa ha ma gbagbukwaa ha n’ekweghi ka onye ọbụla n’ime ha dị ndụ. Ọ sịkwa ha tọhapụ Wadume ka ọ gbalaga. 

Onyonyoo ya bụ ọdachi gosiri ebe otu onye soja na-ekwu sị, “Ha zutere anyị n’ebe nkwụsị ndị nche (check point) nke abụọ. Ọ bụgoduru na ha gbalahụrụ anyị, ha agaghị agbalahụ nkwụsị ndị nche nke dị na Wụkarị.

Ozi anyị nwetere kọwakwara na ndị soja ahụ na ndị Uwe Ojii ahụ kelere onwe ha mgbe ha na-aga ijide ya bụ onyeisi ndị ntọ ma kelekwaa ka ha gafere na-alazị. Kaosiladi, egwu dagharịrị mgbe Kaptin ahụ kpọrọ ha gwa ha chụwa ma gbagbuo ha.

Ndị soja wakpoziri ha na mberede site na isi n’azụ were kwawa ụgbọala bu ha mgbọ aghara aghara.

Nsogbu dịkwa n’obodo a,hoo!haa!!

1 Comment

  1. Nnukwu nsogbu di.
    Ngozi Nwarunta




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.