ASABA:AKA AKPARALA ỌKỤ ENU ZURU TV

Spread the love

Asaba: Aka akparala otu nwanyị zuru ohi TV n’ụlọ nkwari akụ Kevleyn Hotel n’Asaba, Delta Steeti n’ụbọchị Satọdee.

Ya bụ ọkụ enu (slay queen) aha ya bụ Lauretta, ka ya n’enyi ya nwoke kpara nkata iji zuo ya bụ TV ọgbara ọhụrụ bụ “plasma TV” ka ha nọchara otu izu ụka ebe ahụ. 

Ka o bu akpa “Ghana Must Go” TV ahụ dị n’ ime ya na-apụ, ọ gwara onye nnabata (receptionist) ụlọ nkwari akụ ahụ na enyi ya nwoke ka nọ ya.

Ka ọ gachara elekere atọ, enyi ya nwoke ahụ pụrụ sị ka ya zụta ihe bịa, si ya rie mbọ mbọ.

Gụkwuo: https://www.hoohaa.com.ng/2019/08/09/akwula-ka-umu-nwanyi-anambara-no-maleshiya-na-agbazi-aswam

Ka e mechazịrị chọrọ ya bịa be nwanne ya nwanyị, ndị nlekọta ụlọ nkwari akụ ahụ nụzịrị na ìgwè mmadụ tiri Lauretta ihe maka izu Narị puku Naịra asatọ (N800, 000) nke nwoke ya na ya rahụrụ. 

Ka okwu pụrụ ụlọikpe, ọ fọdụrụ ntakịrị ka a tụọ ya n’enyi ya nwoke nga. Ka a kpuru ya ruo n’ụlọ nkwari akụ ahụ, tatụ ya obere ahụhụ, ọ kwupụtara na ya ji TV ahụ biri mmadụ puku Naịra ise.

A gakwara bute TV ahụ n’aka ndị ahụ.

Ụmụ agbọghọ ugbua ereela ihere n’ahịa gbara ọtọ ma gbakwara aka na-amachagharị. A kpọọ ha “Slay Queen”, ha-aza. Ha amaghị na “Slay Queen” pụtara ỌKỤ ENU. Tụfịakwa!

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.