ASABA:ONYE DPO A TỌỌRỌ AKWỤỌLA N3M EGO MGBAPỤTA

Spread the love

Asaba: Onyeisi ụlọ ọrụ ndị Uwe ojii (the Divisional Police Officer) dị na Galilee, Ute-Ogbeje n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Ika na Delta Steeti a tọọrọ ka a kwụọ ọrụ ego mgbapụta nde naira atọ iji gbapụta ya.

A tọọrọ nwa amadị a aha ya bụ Mazị Okoro, ụbọchị Fraịdee n’ụzọ awara awara Bini-Asaba n’Ọnicha Ugbo.

Onye achọghị ka a kpọọ aha ya nọ n’isi ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ kọwara na-a kwụrụ ndị ntọ ahụ Nde Naịra atọ.

Ndi ntọ ahụ gbara egbe aghara tupu ha e buru nwoke ahụ tinye isi ebe mmadụ amaghị.

O nweere onwe ya ụbọchị ụka, ka e dewere ego ahụ n’ebe ndị ntọ kwuru.

Kaosiladi, Kọmishọna ndị Uwe Ojii na steeti ahụ bụ Mazi Adeyinka Adeleke, gọrọ agụgọ na atọghi onye uwe ojii ma fọdụzịa ịkwụ ego mgbapụta.

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/13/onyeisi-ndi-nto-zunyere-kaptin-si-si-gbagbuo-ndi-uwe-ojii-ugboala/

Ọ sịrị na ọ bụ enyi DPO ahụ ka a tọọrọ.

Naịjiriya, nsogbu wazị ọgọdọ! Ebe a na-atọzị ndị Uwe Ojii, na-anata ha ego mgbapụta. Onye ga-ejidezi ndị ntọ?

Leave a Reply

Your email address will not be published.