EGBOCHIWO NWANYỊ DI YA NA-ETIGBU IGBU ONWE YA

Spread the love

Ọka: Ndi agbata obi egbochiwo nwanyị dị iri afọ abụọ n’asaa igbu onwe ya maka mmegbu nakwa ihe di ya na-eti ya.

Nwanyị ahụ bụ Praise kwadoro igbu onwe ya nakwa nwa ya nwoke dị afọ abụọ ụnyahụ bụ Tuuzdee.

Ozi hoo!haa!! kwuru sị, “N’ọnwa Eprel  Praise kwuru na di ya na-emekpa ya ahụ nke ukwuu nke mere na ya agbalawo be nne na nna ya ugboro atọ, ndị chughachiri ya sị ya mara ihe o ga-eme ka alụmdi na nwunye ha gaa n’ihu.

“Ụbọchị Mọnde, ọ dere edemede igbu onwe tọgbọ ebe ọ kọwara ihe o jiri chọọ igbu onwe ya. Ekele dịrị Chukwu na mmadụ hụrụ ya n’oge were chewezia ya nche. ”

Edemede igbu onwe ya ahụ kwuru sị, “Ụwa anyị nọ na ya ugbua, ọ nweghị onye chọrọ ịma. Ị nọ n’alumdi na nwunye ebe a na-akpagbu gị, o nweghị onye chọrọ ịma – ọha obodo, ikwu n’ibe ma ndị enyi.

“Sọ ihe ha na-asị anyị bụ anyị kpewe ekpere, diwe ebe mmerụ ahụ anyị na-anata na abawanye. Ị kwara gbalata ha agwa gị laghachi azụ ga mezie ezinụlọ gị.

“Akọm ọnụ akarịa; a kpọọ gị ajọ nwunye, a kpọọ gị akwụla, na ị na-esi ísì ọjọọ, na ị na-eme na i nwetara akara nzere mmụta 2.1 na mahadum, bịanụ ka e nye gị ego iji kwụọ ụgwọ ịhapụ mahadum. 

“A ga m anwụ, a ga m akpọrọ obere nwoke m. A gaghị ahapụ ya ka ọ tawa ahụhụ; anyị ga-aga ebe anyị ga-enwe udo ebighị ebi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.