ỌCHỤ NDỊ OTU NZUZO GBURU: AKA AKPARALA “BABY AWKA”

Spread the love

Ọka: Eze ahịa n’Eke Ọka bụ Ọzọ Emeka Agụmadụ, onye a na-akpọkwa “Baby Awka” ka ndị Uwe Ojii nwuchikọworo.

N’ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị Uwe ojii n’Anambara Steeti, Haruna Mohammed taa   bụ Wenezdee, a nwuchikọrọ Agụmadụ maka iji ego akwado ọgụ nakwa ọchụ ndị otu nzuzo na-egbu n’obodo ahụ.

Mohammed kwuru na Kọmishọna ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, John Abang n’onwe ya nọ n’isi otu gara kpụrụ eze ahịa ahụ na mmadụ atọ ndị ọzọ.

O kwuru na “Baby Awka”,onye nke so na ndi ichie obi eze n’Ọka bụ ụnyahụ ka a kpụụrụ ya.

Ozi ahụ kwuru sị, “Cheta na ndị otu nzuzo abụọ,  ndị Black Axe na ndị  Vikings lụrụ ọgụ n’Eke Ọka nakwa Dike Park dị n’Ọka, ebe a nọrọ gbuo otu nwa amadị bụ Chinedu, onye amatabeghi aha nna ya, a makwaara dịka Nambo ya na nwa amadị aha ya bụ Uche  Anara.

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/10/okammonwu-nozi-ngaghari-iwe/

“Site  n’ama a gbaara anyị, ndị Uwe Ojii nke Kọmishọna ndị Uwe Ojii Jọn Abang nọ n’isi ya jere n’abalị iri n’atọ nke ọnwa Ọgọọst n’ebe elekere anọ nke mgbede na Dike Park nakwa Umukwa, Ọka, ebe ha nwuchikọrọ mmadụ anọ ndị a na-enyo enyo na ha so ma jirikwa ego na-akwado ndị otu nzuzo Black Axe na Vikings.

Aha ndị ahụ e jidere gụnyere Prince Collins Ozojiofor, Okechukwu Nwaneke, Nwankwọ Chukwuma nakwa Ọzọ Emeka Agụmadụ, onye a makwa dịka “Baby Awka”

Leave a Reply

Your email address will not be published.