URU FACEBOOK:NWA “BANANA” AHỤLA ONYE GA-AZỤ YA RUO MAHADUM

Spread the love

Legos: Sunday Etim, nwa na-ebugharị unere dị afọ iri abụrụla onye ebumnobi o nwere ịlaghachi ụlọ akwụkwọ bịara na mmezu, ụnyahụ bụ Tọọzdee site n’enyemaka Facebook. 

Mazị Wiliam Uche Mba,nwa afọ Abia Steeti bi na mba Amerịka ekpebiwo ịzụ ya n’akwụkwọ ruo mahadum.

Ka ọ hụchara onyonyo nwatakịrị a ebe ọ na-ehi ụra n’ogologo ụzọ n’ime ndeeri, buru ụkpa unere dọdebe onwe ya, o metụtara ya nke ukwuu.

Ozigbo ahụ, ọ gbara mbọ i si n’aka ndị enyi ya nọ Legọs chọta nwa ahụ.

Ka Chi ya si meere ya ihe, a chọtazịrị Sọnde echi ya n’ihi na onyonyoo ahụ gosiri na ebe ahụ e setere ya bụ n’ụzọ na-ewu ewe dị n’Ikeja, Legọs.

Site n’aka onye ọ ma na Naịjiriya, Wiliam kpọzịrị Sọnde na “video call”

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/16/onye-keke-ezigbo-mmadu-na-eweghachi-ihe-e-chefuru-na-keke-ya/

Ọ chọpụtara na nwatakịrị ahụ bụ onye Akwa Ibom ya na mmadụ bi, na nwanyị ya na ya bi na-edinye ya ịga bugharị ahịa ebe ụmụ nke ya na-aga akwụkwọ.

Ngwa ngwa, enyi Wiliam ahụ duuru nwatakịrị ahụ gakwuru nne ya ukwu na be ya na Shogunle, Ikeja. O mechara kweta ka akpọlaara Sọnde ndị be ha n’Akwa Ibom Steeti.

Ka egwu, ka egwu, dịka ihe na-eme n’akụkọ ifo, Wiliam tinyere nwata ahụ n’ụgbọ elu, e bulaa ya Ụyọ, Akwa Ibom ịlakwuru ndị mụrụ ya, ọ bụghị nke iji ụgbọ ala!

Ọzọkwa, o kpebiri ịzụ ya n’akwụkwọ ruo mahadum ma nyekwara ndị be ha aka.

Kaọdịugbua, Sọnde erutewo Uyo n’udo ma lakwukwara ndị be ha ndị ọṅụ juru obi.

Bikonu, onye sị na ama ozi mkpakọrịta dịka Facebook enweghị uru ọ bara?

Leave a Reply

Your email address will not be published.