UGWUTA:IRI JI EZE ABDULFATAR EMETUMA

Spread the love

Ugwuta: Eze Abdul Fatar Chima Emetumah nke Ụmụọfọ, Ugwuta mere mmemme Iri Ji n’abalị mbụ n’ọnwa Julaị, afọ a.

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị Igbo bụ ndị ụka taa mana e nwekwara ndị bụ ndị Ọgọ mmụọ nakwa ndị Alakụba.

N’obodo a, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Alakụba mana mmadụ nile na-ebikọrịta n’udo.

Eze Abdul Gafar Ihunanze Duru Emetumah II bụ nna onye eze nọ ugbua, Eze Abdul Fafar Chima Emetumah nabatara okpukperechi ndị Alakụba n’afọ 1970. Otu ahụ ka Alakụba siri bata n’obodo ahụ.

E mechazịrị chie Abdul Gafar eze ọdịnala obodo ahụ n’afọ 1977.

Ka ọ nọchiri nna ya n’oche eze, Eze Abdul Fatar gakwara n’ihu n’okpukperechi Alakụba nke mere Emị̀a ndị Kano, Ado Bayero, lagoro mmụọ jiri chie ya imam n’afọ 1992 n’agbanyeghị na ọ bụ eze ọdịnala.

N’okwu ya, Eze Abdul Fatar kọwara n’Alakuba abụghị usoro okpukperechi ndị Ugwu Awụsa kama na o zuru ụwa nile,bụrụkwa nke na-ekuzi udo n’ịdị n’otu.

Ndị obodo ahụ, ndị gwara onye nta akụkọ anyị okwu kọwara na ndị Ụmụọfọ  nile, n’agbanyeghị ụka onye na-aga na-eso ndị Alakụba na mba ụwa eme mmemme Eid El Kabir.

N’otu aka ahụkwa, ha nile na-esonyekwa na mmemme nke ndị ụka. Eze Abdul Fatar n’onwe ya na-agakwa ụka mgbe ọ bụla e ziri  ya maka mmemme ọbụla.

E nwere ụlọ ekpere ndị Alakụba atọ n’Ụmụọfọ maka o gbochighi eze a ị na-aga ụka nke dị n’ihu obi ya oge ọbụla ọ masịrị ya.

Udiri mmọnwụ dị iche iche nakwa egwu omenala jupụtara na ya bụ mmemme.

E ji ohere ahụ nye Onyeisiala Muhammadu Buhari onyinye nkwanye ùgwù ma chikwaa onyeisi ụlọ ọrụ Chi Limited, Rihaz Uddin bụ nwa-afọ mba Indịya echichi dịka Ugwumba Ụmụọfọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.