ANAMBARA AKWADOLA ỊKPA EHI IGBO

Spread the love

Ọka: N’ihi oke mwakpo nakwa ogbugbu Ndigbo na-anatazị n’aka ndị nchị ehi ndị Fulani, Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Anambara Steeti akwadowo atụmatụ ịkpa ehi Igbo.

Mazị Carter Ume, onye nnọchiteanya mpaghara Aguata 1 n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Anambara Steeti kpọrọ oku ahụ ụnyahụ n’ọgbakọ ụlọ nzukọ omebeiwu ahụ oge o kwukwara na ọ dị mkpa ka Gọọmenti Steeti ahụ nye ntụziaka ka Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo wepụta atụmatụ maka ịmalite ịkpa ehi Igbo na steeti ahụ.

Gụkwuo: http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/08/imegide-nto-ndi-fulanindi-dinta-di-mkpa-chima-obieze/

Ume kwuru na nkea ga-eme ka anụ dị ọfụma na steeti ahụ ma gbochikwaa mkpochapụ ehi Igbo.

N’ikwado okwu ahụ, onye nnọchiteanya mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Anambara, Mazị Obinna Emenaka sịrị na atụmatụ ahụ magburu onwe ya.

O kwukwara na nkea ga-eme ka ọrụ ugbo bawanye na steeti ahụ iji mee ka ndị ntorobịa nwee ọrụ.

Ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu ahụ nile nke  Osote Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Steeti ahụ, Paskal Agbodike nọ n’isi oche nke ọgbakọ ụbọchị ahụ kwadoro okwu ahụ. 

A tụziri anya na Gọvanọ Anambara Steeti, Wili Obianọ ga-emezi ihe a tụrụ anya n’aka ya site na ịmalite ịkpa ehi Igbo

Kaọdịtaa, Gọọmenti Akwa Ịbọm amalitewo ịkpa ehi nke ha.

Bikonu, ndị Gọvanọ Ala-Igbo ana-egekwa ntị ịma ihe ndị be ha chọrọ?

Leave a Reply

Your email address will not be published.