ENUGWU:NGOSIPỤTA AKWỤKWỌ POLO MALL AMALITEWO

Spread the love

Enugu: Ngosipụta akwụkwọ Polo Mall, Enugwu na-aga n’ihu ugbua n’ogige Polo  Mall (Polo Park), GRA, Enugwu.

Site n’okwu Mazị Uche Anịoke, otu onye n’ime ndị nhazi ya bụ ngosipụta akwụkwọ ahụ, nke a bụ nke anọ a na-eme ya bụ mmemme.

Anịoke bụ onye ọrụ mbipụta akwụkwọ (publisher) a mara ama ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka onyeisi oche Okpuru Ọchịchị Ọ̀gwụ̀, n’Enugwu Steeti n’oge gara aga.

Ọ kọwara na ebumnuche ngosipụta akwụkwọ ahụ bụ iji mee ka ìgwè mmadụ na-abịa n’ogige ahụ ikpori ndụ nwee ohere ịzụtakwa akwụkwọ maka oke mkpa akwụkwọ nakwa Agumakwụkwọ dị na ndụ mmadụ

“I lee anya ndị nne nakwa ụmụaka na-agagharị ebea, ihe ha na-azụtara ụmụaka bụ ihe a na-arachaa aracha nakwa ihe a na-ata ata sọọsọ ka ha na-azụrụ ụmụaka, ebe e nwere ihe ọ ga-abụ ị zụtara ụmụaka, ọ baara ha uru n’ótítò(advancement ), n’ọzụzụ na mmụta”

O kwuru na ngosipụta akwụkwọ ahụ ga-anọ otu ọnwa iji nyere ndị nne na nna aka ịzụta akwụkwọ ụmụaka ha ga-eji laghachi ụlọ akwụkwọ, ma akwụkwọ bido.

Ndị ụlọ ọrụ bịara ngosipụta akwụkwọ ahụ gụnyere ndị CNC publications( nke a ma uru dịka abic books), Pens & Voices, tinyekwara ndị mkpokọ Ike ga bụ ụlọ ọrụ ha ahụ maka akwụkwọ e ji akwalite asụsụ Igbo,wdg.

O kwukwara na uru dị na ya bụ mmemme bụ inyere ụmụaka ndị nọ ezumike inwe ohere ịhụ akwụkwọ dị iche iche nke ha agaghị ahụ n’ụlọ akwụkwọ.

Ọzọkwa, ọ sịrị na ọ bụ ohere maka ndị isi ụlọ akwụkwọ ilegharị anya mara akwụkwọ ndị ha ga-achọ n’ụlọ akwụkwọ ha.

Ngosipụta ahụ na-ebido n’ụtụtụ ụbọchị ọbụla ruo na mgbede.

Anịoke kọwakwara usoro ndị mbipụta nakwa ndị na-ere akwụkwọ ga-eji sonye na ya bụ mmemme.

“Nke mbụ, onye ahụ ga-etinye aka n’akwụkwọ iji kwe nkwa na o nweghị akwụkwọ adigboroja o bu abịa, na akwụkwọ o bu abịa bụ nke o dere ma ọ bụkwanụ nke ọ nwere ikike ndị  bipụtara ya. O mezuo ihe ndị a tupu ọ kwụzịa ngwọ maka nsonye”

Atụmatụ a magburu onwe ya bụrụkwa nke kwesịrị nkwado maka na akwụkwọ Nsọ kwuru na “ọ bụghị sọ na nri ka mmadụ ji adị ndụ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.