IPOB GA-ANWỤCHIKỌ BUHARỊ, MA Ọ GBA ỤKWỤ NA JAPAN-NNAMDỊ KANỤ

Spread the love

Ka a na-eti mkpu mwakpo ndị IPOB wakporo onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisi Ụlọ Nzukọ Sineti Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadu na Nuremberg, mba Jamani, onye ndu IPOB, Mazị Nnamdị Kanụ enyekwala ụmụazụ ya ntuziaka ịwakpo ma nwụchikọọ Onyeisiala Naịjiriya bụ Muhammadu Buhari na njem ọ na-abịa na mba Japan.

N’aka nke ọzọ, igwe mmadụ dị ka igurube zutere Sinetọ Ike Ekweremadu ụnyahụ ka ọ batara Enugwu, si n’ọdụ ụgbọelu duru ya ruo be ya na njem ndọnye ụkwụ.

N’ozi o zisaara ndị otu ya, Mazị Kanụ kwuru sị, “A nọ m ugbua na-eti iwu nye ezinụlọ IPOB kara aka nọ na Japan ịhụ na ha nwụchikọrọ Jubril Al-Sudaini, onye nke na-akpọ onwe ya Buhari ma nyefekwaa ya n’aka ndị Uwe ojii obodo ahụ, ma ọ gba ụkwụ na mba ahụ.

N’agbanyeghị na Sinetọ Ekweremadụ mere ihe ịtụnanya site na ịgbaghara ndị a wakporo ma menyekwa ya akaja, o nweghị onye ma ka okwu ịwakpo Buhari ga-esi ga.

Nke mbụ, dịka  Buhari si bụrụ onyeisiala, mba Japan agaghị agba nkịtị ka a wakpo ya ka ọ bịara ọgbakọ na be ha.

Ọzọkwa, Buhari abụghị Ekweremadu, onye mere ka Poopu Jọn Pọl II, onye gbaghara onye chọrọ igbu ya.

Kanụ sịkwara na Buhari bụ “onyeisiala adigboroja, onye a na-achọ achọ maka igbu ọchụ nakwa mkpochapụ mba na-aga n’ihu n’ala Biafra”

Ọ gakwara n’ihu gwa ha n’enweghị ihe na-eme maka na “okwu ọbụla ga-apụta ga-ebi n’ụlọ ikpe ndị Japan ebe ụwa ga-anọzị mata na Jubril bụ Buhari adigboroja”

N’okwu nke ya, onye ndu ndị n’anọghị n’ọchịchị(opposition) ma bụrụkwa onyeisioche ọgbakọ ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, Sinetọ Enyinnaya Abaribe dọrọ ndị IPOB aka ná ntị banyere ịwakpo onye ọchịchị ọbụla n’ala bekee, ma n’ala a ma ọ bụ n’ala bekee.

O kwuru sị, “A na m aga njem izu ụka ọzọ. A ga aga Houston, gakwaa Atlanta. A chọghị m ịma, a ga m aga ebe ọbụla m chọrọ. N’agbanyeghị mwakpo a wakporo ya, Sinetọ Ekweremadu ekwuola sị ndị ọbụla gawa ebe ha chọrọ ịga.

Hmm, ọ kwanụ ka o si ebido. Nsogbu dịkwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.