ASABA:AKA AKPARALA ONYE OHI IGWE ỌKỤ ‘GENERATOR’

Spread the love

Asaba: Otu nwokorọbia dị iri n’itolu ka aka kpara n’ụtụtụ taa n’Asana maka izu ohi ígwè ọkụ (generator). 

Nke a mere na Ụzọnta (Drive) Pita Ofuose dị n’ụzọ Infant Jesus n’Asaba.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na nke abụghị mbụ onye omekome a na ndị otu ya na-ezu ígwè ọkụ ndị mmadụ n’ogbe ahụ.

Kaosiladi, iko onye ohi ahụ si na-aha bụ Toni juziri maka na ọ maghị na onye ọ bịara izu ohi ka nọ n’ụlọ.

Mgbe e jidere ya, ọ sị na onye nwe Ígwè ọkụ ahụ sịrị ya butere ya buga ya n’ebe a ga-emezi ya.

Ọ maghị na onye nwe ihe ọ bịara izu so ná ndị na-ajụ ya ajụjụ ahụ. 

Ụmụ okorobịa ogbe ahụ na-akụzị ya ihe ka e si akụ onye ohi tupu ndị Uwe ojii bịa zọpụta ya kpụrụ ya gawazịa ụlọ ọrụ ha.

1 Comment

  1. Biko, obi dim anuri site na- edemede akukoa, olee uzo mga esi kwado unu?.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.