‘ENERGY SAVING BULB’ NA-EBUTE ỌRỊA CANCER -DỌKỊNTA ỌCHỌNỌGỌ

Spread the love

Legọs: Ọkachamara n’okwu banyere mkpofu ngwa latrik abaghịzị uru, Dọkịnta Ifeanyị Ọchọnọgọ enyela ụmụ amaala Naịjiriya ịdọ aka ná ntị banyere iji (usage) nakwa mkpofu bọlbụ latrik ọgbara ọhụrụ ‘Energy Saving bulb’. 

O kwuru na mmiri mmụọ ( chemical ) na-ebute ọrịa cancer nke nọ ya n’ime.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ na Legọs, Ọchọnọgọ sịrị na ndị ọkachamara sayensị emeela nnyocha maka mekuri dị n’ime bọlbụ ndị ahụ a na-akpọkwa Compact Fluorescent Lamp (CFLs) na bekee.

”Mekuri si na CFL ga-ebutenwu cancer nakwa ọrịa ndị ọzọ.

“Ị kụwaa bọlbụ CFL ndi a, mmiri mmụọ dị njọ maka ndụ mmadụ na-esi n’ime ha apụta, ihe ikpe azụ mmadụ ga-achọ ị kụrụ n’ume bụ ikuku mekuri.

“Bọlbụ ndị a na-ebutekwa ike ọgwụgwụ nakwa ajụ ibu mmadụ. Anyị kwesịrị ịkpachapụ anya maka ihe ndị anyị na-azụta ma na-ejikwa(use) “Ọchọnọgọ, Onye nhiwe otu Ewaste Relief Foundation, kwukwara. 

Site n’ihe ọ gụtara n’akwụkwọ akụkọ mba ofesi, Daily Mail, ụfọdụ ndị ọkachamara sayensị si mba Jamani na-ekwu na mmiri mmụọ ndị na-ebute cancer na-apụta ma a gbanye bọlbụ ndị a gụnyere : fenọ̀l, Neftalene, Styrene nakwa ikuku mekuri.

O kwuputakwara mkpa ọ dị iwepụta atụmatụ maka iji bọlbụ ahụ mụ ọkụ nakwa mkpofu ya n’ụzọ ziri ezi n’ihi mekuri ahụ nọ ya n’ime.

Hmm, keduzi nke gara aga? 

Leave a Reply

Your email address will not be published.