NKESA USORO NCHEKWA GA-AKWALITE ỌRỤ NCHEKWA-EKWEREMADU

Spread the love

Enugwu: Onye jibụ ọkwa dịka Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadu ekwuola na sọọsọ nkesa usoro nchekwa bụ ọgwụ dịịrị nsogbu nchekwa na Naịjiriya.

Ike Ekweremadu kwuru nkea ụnyahụ, oge ndị otu ụmụ nwanyị bụ ndị nta akụkọ bụ  Nigeria Association of Women Journalist (NAWOJ), ngalaba Enugwu Steeti bịara ya njem ndonye ukwu n’ụlọ ya n’Enugwu

“A na m akpọ oku maka nkesa usoro nchekwa maka na nke bụ eziokwu bụ na – abawanye na Naịjiriya maka udiri usoro nchekwa anyị nwere”

“Sọọsọ Naịjiriya bụ mba nwere usoro nchekwa etiti. O nweghị ebe ọzọ ọ dị etu ahụ.

O kwukwara na e kwesiri inwe uwe ojii Steeti iji nye aka belata mpụ nke na-achọzị ilo obodo Naịjiriya.

N’okwu nke ya, nwunye ya bụ Dọkịnta Nwanneka Ekweremadu kwere ndị NAWOJ nkwa na otu Ikeoha Foundation ga-adọnyere ha ukwu iji buo agha megide mpụ dị iche iche, ọ kacha idina obere ụmụaka ụmụ nwanyị n’ike.

Oriakụ Chinyere Mgbọ, Onyeisi oche NAWOJ, Enugwu Steeti nọrọ n’okwu ya katọọ mwakpo ahụ ndị IPOB wakporo Ekweremadu na mba Jamani.

Leave a Reply

Your email address will not be published.