EWETAWORO ENUGWU KỌMISHỌNA NDỊ UWE OJII A CHỤRỤ NA KADUNA

Spread the love

Enugwu: Ewepuwo Kọmishọna ndị Uwe Ojii Enugwu Steeti bụ Suleiman Balarabe. 

Nkea bụ maka mkpesa si n’aka ọtụtụ ndịsonwere Steeti ahụ, na ya bụ nwoke enweghị ihe ọ na-eme maka ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị na steeti ahụ.

Otu jikọtara ụmụ akwụkwọ bụ National Association of Nigerian Students (NANS) ngalaba Steeti ahụ nakwa otu a kpọrọ Enugu Peace and Development Mandate socha kpọọ oku ịgbara nwoke ahụ ụgbọ nwa mkpi.

Mana, onye nọchiziri ya bụ  Ahmad Abdurahamn bụ onye a chụpụrụ na Kaduna Steeti maka na o nweghị ihe o menwuru maka ogbugbu n’ọgbaghara na-arị ibe ya elu na steeti ahụ.

Keduzi ihe mere mmadụ ga-eji ree nkịta ma zụrụkwa enwe.

Ọtụtụ ka na-ekwukwa na ihe ga egbo ọgụ na steeti ahụ bụ Gọọmenti Steeti ahụ iwepụta iwu ga-amachibido ịchị ehi akpagharị, ebe ọ bụ na ọtụtụ na-akpazị mkpa mkpa ebe ahụ bụ ndị Fulani ndị nchị ehi

Leave a Reply

Your email address will not be published.