NTIKPỌ ỤLỌ EKPERE ALAKỤBA, AKA M ADỊGHỊ YA-WIKE

Spread the love

… Onye tikpọzịrị? 

Pọt Haakọt: N’abalị iri abụọ nke ọnwa Ọgọọst, ka e tikporo ụlọ ekpere Alakụba dị na Rainbow na mpaghara Trans-Amadi nke ndị Alakụba na Rivas Steeti na-ekwu na-aka Gọọmenti Steeti ahụ dị na ya. 

N’agbanyeghị na Gọọmenti Steeti ahụ sịrị na ihe ahụ akụkọ asị, ụfọdụ gakwara n’ihu katọọ ya bụ akparamagwa. Ndị ọzọ kwukwara na o nweghị ụlọ ekpere Alakụba ọbụla nọ ebe ahụ, na ebe ahụ bụ ụlọ a na-arụ arụ.

Ihe mere okwu a jiri rịa elu bụ okwu Gọvanọ Steeti ahụ Nyesom Wike kwuru n’ọnwa Juun na Rivas bụ “Steeti ndị otu Kraịst”

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ, Aliu Sadiq, odeakwụkwọ ụlọ ekpere Alakụba ahụ sịrị na ngige(fence) nakwa ntọala ụlọ ahụ ka ndị ọrụ Gọọmenti Steeti ahụ tikporo.

O kwuru na n’agbanyeghị na arụchabeghi ya, na ha na-ekpe ekpere ebe ahụ.

“Kemgbe afọ 2008 anyị nọ ebe ahụ ekpe ekpere nke a bụ ugboro abụọ Gọọmenti Rivas Steeti na-etikpo ya. Nke mbụ bụ  Chibuike Amaechi, ugbua bụzị Wike. Anyị jikwa akwụkwọ ikike nile maka ala ahụ.

Kaosiladi, Nyesom Wike bụ Gọvanọ Steeti ahụ kọwara ihe ahụ nile dịka okpokpo asị.

“Ihe akụkọ asị si n’aka ndị ajọ obi. Kedu ka ha siri kwuo na e tikporo ụlọ ekpere Alakụba ebe o nweghị ụlọ ekpere Alakụba ọbụla nọ ebea ahụ?

” Onye tọrọ ntọala ụlọ ahụ kpụpụrụ Gọọmenti Rivas Steeti ụlọ ikpe. Gọọmenti Rivas Steeti merikwara. Ihe ha chọrọ bụ ịmalite ịrụ ụlọ ebe ahụ n’ụzọ iwu megidere iwu, iji kpoo Gọọmenti Rivas Steeti n’ụkwụ.

” Gọọmenti gwakwara ha kwụsị ọrụ mana ha jụrụ nke mere ụlọ ọrụ Gọọmenti nke a dị n’aka jiri kụtuo ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.