GWANỤ PHYNO NA OWU ASAGBUO M-EJIMA PHYNO

Spread the love

Phyno, odogwu na eti egwu, ezigbo aha ya bụ Chibụzọ Azụbụike ka ejima ya rịọrọ ka ọ gbatara ya ọsọ enyemaka ma “tinyekwa ya n’ihe a na-eme”

Ejima ya nkea aha ya bụ Nnọlị Ụzọdịmma bụ onye Ojoto dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Idemili n’Anambara Steeti. Ọ bụkwa onye nche ogbe(vigilante)

Chetakwa na Phyno, onye nke a makwa dịka Ezege bụ onye Ọka, Anambara Steeti

Ọ bụ Igwe Elibe Agwụ Agwụ, onye na-emebi ihe nkiri zutere ya n’akwamozu n’Ojoto, ebe o bu egbe nọrọ ọrụ nchekwa.

Oge a jụrụ ya ihe ndị mmadụ na-ekwu ma ha hụ ya, ọ sị na ha na-akpọ ya Phyno.

“Ị mago, oge ọbụla ndị mmadụ hụ m, ha a na-akpọ m “Phyno, Phyno, Phyno”  ha na-asị na mụ na Phyno eyika”

Ka a jụrụ ya ihe o nwere ịgwa Phyno, ọ sịrị

“Phyno mata na m bụ nwanne ya n’afọ. Ya gbaa mbọ mara ihe ọ ga-eme ka e tinye m n’ihe a na-eme”

Mana ndị bụ ejima Phyno kazị nkụ. Otu n’ime ha bụ  Amaechi Perfect Gidiọn, nwa afọ Mbieri nke dị n’Okpuru Ọchịchị Mbaitoli, Imo Steeti.

Ejima Phyno nkea bụkwa onye oti egwu. Ya na Phyno zutere onwe ha n’afọ gara aga ebe Phyno bịara iti egwu n’Owere, Imo Steeti.

Amaechi, onye kesara onyonyoo ha abụọ sere na Facebook kwuru sị:

“Ọ hụrụ m, o rie ya ọnụ, o tie… ” Phyno”

Onye nkea na Phyno yikwara onwe ha nke ukwuu mana ọ katụ Phyno ogologo.

Onye nke a bụkwa ‘ejima Phyno’ ọzọ na-akwụgharụ na-achọgharị Phyno. Onye nke bụ Iheanyị Nwosu, onye Mbaise.

Chai! Ezege, ataala ahụhụ! Ezege diweooo! Ọ ihe dị na mmadụ ihe ịbụ onye a ma-ama. Kpọọnụ ‘ndị Ejima’ mara ihe ị ga-emere ha.

Onye nwee ego, o nwee ụmụnna. Unu ahụlanụ ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.