NDỊ AKPỤ OBI ROCHAS GBARA M EGBE, Ọ NAGHỊ ESHI-NDỤBỤAKỤ

Spread the love

Owere: Ichie Jaspa Ndụbụakụ, Onyeisi oche otu aka ọkụ Gọọmenti Imo Steeti guzobere maka Mweghachi Akụnụba Gọọmenti steeti ahụ ka ndị akpụ obi tiri eti eti, gbaa egbe ma gbukwaa mma ugboro ugboro. 

Nkea kpọtụrụ ụnyahụ bụ Tọọzdee n’Owere oge nwoke a kajara aka duuru ndị otu ya ndị sikwara ike were gaa n’ụlọ Sinetọ Rochas Okorọcha, onye chịburu Steeti ahụ ịga mee nchọcha ma burukwa ngwo ngwo gọọmenti Steeti ahụ ha sị na Rochas dọwara ebe ahụ.

Kaosiladi, mgbe ha rutere n’agadaga ụlọ ahụ dị na mpaghara Spibat n’Owere, ndị ntorobịa ndị akpụ obi nke Rochas zutere ha, agha wee daa.

Ndị ọzọ gbalagara hapụzịa sọọsọ Ndụbụakụ bụ onyeisi ha, onye ọsọ ekweghị ọgbụgba.

Ndụbụakụ gwara ndị nta akụkọ sị, “Anyị ji ikike ụlọ ikpe bịa ime nchọcha banyere ngwo ngwo gọọmenti o buuru oge ọ nọ na Gọọmenti anyị chọrọ iweghachi.

” Anyị nọ n’ọnụ ụzọ ámá chere dịka onye nche ya siri kwuo ka anyị nyere ya akwụkwọ ikike ahụ anyị ji.

“Ka anyị na-echezi ndị akpụ obi Rochas siri n’ụlọ ahụ pụta baso anyị ọgụ,  ha gbara egbe ma gbukwaa m mma mana ọ naghị eshi.

N’izu ụka olemole gara aga, Ndụbụakụ na ndị ọrụ ya wakpokwara ụlọ ahịa Oriakụ Ụlọma Nwosu bụ ada Rochas Okorocha nakwa ụlọ akwụkwọ Rochas Foundation.

Sam Ọnwụemeọdọ, ọnụnaekwuru Rochas kwuru sị:

“Ọchịchị Ihedioha ka na-aga n’ihu na mwakpo na mmekpa ahụ ọ na-enye onye chịburu Imo Steeti bụ Owele Sinetọ Rochas Okorocha n’ezinụlọ ya.

” Ha gara iwakpo ụlọ Rochas nọ na Spibat mana ndị ntorobịa, ndị ihe Rochas na-amasị gbakọtara chụsaa ha.

“Otu ka ha siri wakpokwaa ụlọ ọrụ ada Rochas bụ Oriakụ Ụlọma Nwosu, maa ya ụra ma bukọkwaa ngwo ngwo ya n’ejighi akwụkwọ ikike ọbụla.

Ọ rịọkwara Gọvanọ Ihedioha ka ọ kwụsị ime nkea ma gbadoo anya n’ọrụ ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.