BỊAFRA ADỊWO NSỌ-ASARI DỌKỤBỌ

Spread the love

Pọt Haakọt: Alahaji Asarị Dọkụbọ, onye ndu otu ọlụọ ọlaa Niger Delta Peoples Volunteer Force (NDPVF) ekwuola hoo!haa! na ọbịbịa mba Biafra adịwo nso.

O kwuru nkea n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ na Pọt Haakọt.

Nwoke a bụbu onye ọ lụọ ọ laa sịrị na nkea bụ maka na e nweela ezi mkpebi n’etiti Ndigbo nakwa ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ala anyị ndị ọzọ iji rụkọọ ọrụ maka nnweta Biafra.

“Kaọdịtaa, ọbịbịa Biafra abịawo nsọ. Ọ bụghịkwa ihe ‘ike otu onye’. Mpaghara atọ e nwere na Biafra esonyela n’uju.

” Ma Ndigbo, ma ndị Ijọ/Ogoni, ma ndị Akwa/Cros. Ugbua, ụwa nile amatawo na ọ bụghịzikwa egwu ụmụaka.

Dọkụbọ kwekwara nkwa itinye ihe nile o ji biri, ma tinyekwuo ndụ ya iji hụ na enwetara Biafra ka ndị Biafra pụọ na mkpagbu ndị Fulani

“Site n’ike nke Chukwu, a ga m eji ihe nile m ji biri tinyekwara ndụ m were gbaa mbọ ịhụ na e nwetara Biafra”.

Ọ gakwara n’ihu kọwaa usoro ọchịchị a ga-enwe na Biafra.

“United States of Biafra bụ nke a ga-ehiwe sure na mkpebi agbụrụ nile dị n’ala Biafra.

“Usoro ọchịchị Biafra ga – abụ nke na-agaghị enwe agbụrụ ma ọ bụkwanụ mpaghara ọbụla ga-akpagbu ibe ya.

” Mpaghara ọbụla ga-enwe akụnụba nile dị na be ha. Ha ga ejide kwa narị (percent) iri asaa ma na-enyekwa Gọọmenti Etiti kwa narị iri atọ.

Kemgbe Asarị pụtara ìhè n’okwu Biafra site na iso chịkọba otu Biafran National Council (BNC) e nwezịrị nnukwu agamnihu n’okwu nnweta Biafra.

Agbụrụ dị iche iche ewerela aka deta akwụkwọ mkpebi isonye na Biafra. Iji maa atụ, ndị Kalabarị dị na Rivas Steeti nọrọ na nso a deta akwụkwọ igosi mkpebi ha isonye na Biafra.

N’otu aka ahụ, mpaghara Akwa/Cros ebe e nwere agbụrụ dịka Efik, Ibibio, Ogoja, Boki, Yala, wdg esonyekwala n’uju n’okwu Biafra kemgbe otu Biafran National Council malitere ọrụ.

Mazi Prince will Otobong, nwa-afọ Ákwá Ịbom Steeti so ná ndịsonwere Steeti ahụ bu okwu Biafra n’isi.

Otobong bụ onyeisi otu Biafran Reconciliation Team (BRT) bụ otu foro ntutu taa na mpaghara nile nọ na Biafra ga-ekpezi ma were otu obi chọwa Biafra.

Leave a Reply

Your email address will not be published.