KATSỊNA:GỌỌMENTI NA NDỊ NTỌ ENWEELA ỌGBAKỌ

Spread the love

Katsina: Gọvanọ Katsina Steeti, Alahaji Aminu Bello Masari, nọrọ ụbọchị Tọọzdee nwee ọgbakọ n’etiti ya na ndị ekperime na-awakpo ndị mmadụ n’Okpuru Ọchịchị asatọ nọ na steeti ahụ iji kwụsị ntọrị na steeti ahụ.

Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ gụnyere ndị isi ụlọ ọrụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ, Osote Gọvanọ bụ Alahaji Manir Yakubu, ndị eze ọdịnala nke onyeisi ha bụ Emịya katsina, Alhaji Abdulmumin kabir Usman, odeakwụkwọ Gọọmenti Steeti ahụ bụ Alahaji Mustapha Inuwa, ndị isi oche okpuru ọchịchị ndị mwakpo ahụ metụtara, ndị nnọchiteanya otu Miyeti Allah tinyere ndị Fulani ndị ehi.

E menwuru ọgbakọ ahụ n’ihi mgbaghara ndị Gọvanọ mpaghara Ọdịda Anyanwụ Mgbago Ugwu (North West) nyere ndị ekperime nile na-akpa mkpa mkpa na mpaghara ahụ na nso a.

N’okwu ya, Masari sịrị na ajọ ọnọdụ ahụ bụzi mkparị Gọọmenti Steeti ahụ tinyere Onyeisi ala Muhammadu Buhari, onye nke nwa-afọ Steeti ahụ.

Ọ ṅụkwara iyi na Gọọmenti ya ga-eji ụzọ ọbụla o nwere ike were buo agha buso ndị ekperime na ndị ntọ na steeti ahụ.
N’okwu nke ya Emịya Katsina, Abdulmumini Kabir Usman, rụtụrụ aka na mwakpo ndị ekperime na ntọrị bụ ihe a ga-ejikọ̀ aka ọnụ were buso agha.

Naịjiriya bụ obodo ihe ọjọọ na-akwụ ụgwọ. Ị chọọ ka Gọọmenti kpọọ gị, hụ gị anya, ị malite kpawa aghara.

Leave a Reply

Your email address will not be published.