NDỊ GỌVANỌ ỌWỤWA ANYANWỤ AGBAWORO NDỊ FULANI NA-ACHỊGHARỊ EHI ỤGBỌ NWA MKPI

Spread the love

Enugwu: Ndi Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agbaworo ndị Fulani na-achịgharị ehi na mpaghara ahụ ụgbọ nwa mkpi.

Nkea so n’ozi ha wepụtara n’ọgbakọ ha mere ụnyahụ bụ abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Ọgọọst n’obi Gọọmenti Enugwu Steeti.

Ha machibidoro ndị nchị ehi iji ụkwụ achịgharị̀ ehi site n’otu Steeti gaa n’ọzọ ma ọ bụ site n’otu obodo ruo n’ọzọ.

Ọgbakọ ahụ kpebikwara iji ndị agha ụgbọ elu buso ndị omekome nọgasị n’ime ọhịa na mpaghara ahụ agha.

Ha nyekwara ndị ọrụ nchekwa ikike ijide onye nchị ehi ọbụla ji egbe ma ọ bụ mma na-akpagharị.

Nkea bụ iji mee ka e nwee ezi nchekwa na mpaghara ahụ.

Banyere mmechi e mechiri ọdụ ụgbọ elu Akanụ Ibiam, Enugwu, Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọ elu kwere nkwa na ọdụ ụgbọ elu ahụ ga-emepekwa na Disemba afọ a, ma e mezichaa ya otu o kwesịrị.

Ndị Gọvanọ ahụ kwukwara ọzọ na aka ha adịghị na izite ndị soja ma ọ bụkwanụ ịkpọ oku maka Egwu Eke ndị soja mere na mpaghara ahụ nke tara isi ihe karịrị otu narị mmadụ.

Hmm, mkpebi ndị Gọvanọ a magburu onwe ya mana ndị Uwe Ojii a ga-egekwa ha ntị?

1 Comment

  1. Ndewo maka ozi a Họọ! Haa!

    Ndị gọvanọ anyị a mụrụ na anya rụwa ọrụ ha etu o kwesịrị. Nke aghaghị isite na ị ma aka n’ ịrụ ndị otu IPOB mara ha.

    Ya bụ ihe etiri Mazi Ekweremmadu ebidowori imita mkpụrụ.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.