ENUGWU: NENWE ANABATALA DIG NWOBODO LAWORO EZUMIKE NAKWA NDỊ ỌZỌ

Spread the love

Enugwu: DIG Godwin Chijioke Nwobodo, laworo ezumike bụ otu onye n’ime ndị Nenwe  nke dị n’okpuru Ọchịchị Aninri n’Enugwu Steeti nabatara ma nyekwa onyinye nkwanye ugwu (award) taa bụ ụbọchị ụka, abalị mbụ  nke ọnwa Septemba.

Otu Nenwe Improvement Union (NIU), ngalaba Enugwu nọrọ n’ụlọ nkwari akụ Royal Palace, Enugwu were chịkọba ya bụ mmemme iji nabata ndị be ha ndị nwetagasịrị ọkwa dị iche iche na Gọọmenti.

Ndi ọzọ anabatara gụnyere Dọkịnta Leo Kama, Onye bụ odeakwụkwọ ukwu mahadum ESUT, Oriakụ Maria Aniobi, kọmishọna na-anọchite anya Enugwu Steeti n’ụlọ ọrụ Revenue Mobilization and Fiscal Allocation Commission(RMFAC), Ọkaikpe Nnenna Alukwu, Onye a kpọlitere dịka Ọkaikpe n’Enugwu Steeti, Hon Chinedu Okwu, onye a họpụtara ịnọchiteanya mpaghara Anịnri n’ụlọ nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti tinyekwara Dọkịnta Ada Nwonye bụ onye a kpọlitere n’ọkwa dịka odeakwụkwọ nlekọta nke Mịnịstrị na-ahụ maka Mmiri n’Enugwu Steeti.

N’okwu ya n’oge ahụ, Onyeisioche mmemme ahụ ma bụrụkwa onye nlekọta Ngalaba Mmekọrịta Ụmụakwụkwọ na mahadum ESUT, Ọkammụta Gọdịan Mba kelere onye ọbụla bịara mmemme ahụ n’ụdị pụrụ iche.

Ọ kwukwara na ọ dị mkpa na mmadụ nile ga-ejikọ aka ọnụ maka ọganihu Nenwe, ma ndị nwere ego, ma ndị gụrụ akwụkwọ.

N’okwu nzaghachi ya DIG Nwobodo sị na obi dị ya ụtọ nke ukwuu na Chineke mere ka ọ bụrụ onye Nenwe.

O kwekwara nkwa ịkwado NIU, ngalaba Enugwu n’ụzọ pụrụ iche site na iburu ụzọ lezie anya were chọpụta mkpa otu a nwegasịrị.

Chetakwa na otu Nenwe Integrity Foundation (NIF) anọbuola n’Abụja were nabata ụfọdụ n’ime ndị a n’ọnwa Juun.

Leave a Reply

Your email address will not be published.