IKPEAZỤ HAZIRI MGBALAGA NNE NA NNA NNAMDI KEHINDE KANỤ GBALARA BRITEENỤ

Spread the love

Ụmụahia: Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke Abịa Steeti nyere aka kpọfee nne na nna Mazi Nnamdi Kehinde Kanụ, Onyeisi otu nkewata (faction) n’ime IPOB tupu ndị soja Naijiria e buru Egwu Eke wakpo ha.

Site n’ozi hoohaa.com nwetara n’aka onye ime ụlọ na be ndị be Kanụ, Dọkịnta Ikpeazụ haziri mgbalaga Eze Israel Kanu na nwunye ya, Ugoeze Nnenne Kanu si n’obi ha n’Afaraukwu – Ibeku were gaa mba Briteenụ ka ndị soja nọzị nsọ.

Na mwakpo mkpochapụ mba ahụ nke Bishọọpụ Lucius Ugọjị, Nna Ụkọchukwu nke Ụka Katọliki na Dayọsis Ụmụahịa kọwara dịka ‘akụkọ anya mmiri n’ọbara’, mmadụ narị pụrụ narị ka ndị soja Naịjiriya gbagburu mere ndị ọkaikpe ndị IPOB jiri gbaa Onyeisiala Buhari, Onyeisi Ọchịagha ndị agha Naịjiriya bụ Tukur Buratai tinyere ndị ọzọ akwụkwọ n’ụlọ ikpe arụ mba ụwa(ICC).

Eze Kanu n’ezinụlọ ya gbapụrụ gbalaa mba Briteenụ mana ọtụtụ ndị IPOB obi kara, ndị gba aka bịa ịza oku ichekwa onyeisi ha nakwa ezinụlọ ya ka ndị soja Naịjiriya lara ndụ ha n’iyi.

Chetakwa na ndị nnọchiteanya obodo Afaraukwu-Ibeku nọrọ n’abalị iri n’asaa nke  ọnwa Ọktoba tie mkpu iji gwa ụwa na ha ahụbeghị eze ha kemgbe e mechara mwakpo Egwu Eke n’afọ 2017.

N’okwu ha gwara ndị nta akụkọ n’Ụmụahịa oge ahụ, Emeka Ezebuiro, Nnukwu Onyeisi otu Afaraukuwu Ibeku Development Union, sịrị na ha ka nọ na mgbagwoju anya banyere ofufu eze ha.

O kwuru na nkea buteziri ha oke nchekasị nakwa obi ikoro n’elu.

N’ozi nke ya na ndị Eze na-achị Okwulaga nakwa Enyi ụkwụ, Eze Eddy Ibeabuchi and Eze Philip Ukaegbu tinyere aka, ndị obodo ahụ kpọrọ oku ka aka ọbụla ji onye eze ahụ tọhapụ ya.

Ndị Afaraukwu-Ibeku gakwara n’ihu wezuga onwe ha n’akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ nke na ebo Gọvanọ Ikpeazụ ebubo “iji ihe banyere ọnọdụ eze anyị eme ndọrọndọrọ ọchịchị”

Ezebụiro kwukwara na Ikpeazụ jụrụ ịnabata nkwanye a na-akwanye ya ịchụpụ eze ahụ n’oche eze ya maka na ọ sịrị na o nweghị iwu ọbụla eze ahụ dara. 

“Anyị chọrọ ka o doo anya na ndị be anyị enweghị mgbe ha jiri boo Ikpeazụ ebubo aka ya ịdị na mwakpo a wakporo obodo anyị.

“Anyị makwa mbọ nile ọ gbara igbochi mwakpo ahụ nakwa enyemaka ya ka ọdachi ahụ dakwasịrị anyị.

N’agbanyeghị nkea, Onyeisi IPOB a gakwara n’ihu na-ata Gọvanọ Ikpeazụ ụta maka Egwu Eke ma tinyekwa aha ya n’akwụkwọ dịka onye ndu Ndigbo a ga-eme ‘Ihe e mere Ekweremadụ’

Chetakwa na Sinetọ Ike Ekweremmadu, onye bụbu Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya ka ndị IPOB wakporo na Nuremberg, mba Jamani site na ntuzi aka Nnamdi Kehinde Kanu n’ihi ebubo na o so kpọta Egwu Eke.

Ebubo ahụ kpọdoro isi n’ala maka na Ekweremadu soro gbaa mbọ iji hụ na-agbapụtara Kanụ n’ụlọ mkpọrọ. Ọzọkwa, o degaara Onyeisiala Buhari akwụkwọ ịrịọ ka a kwụsị Egwu Eke ma gakwaa n’ihu katọọ mwakpo ahụ, ka e mezịrị ya.

Ajụjụ bụzị: Ọ bụrụ na Gọvanọ Ikpeazu nyere aka hazie mgbalaga nne na nna Kehinde Kanụ gbagara mba Briteenụ, gịnị mere ọ ka ji ebo Gọvanọ Ikpeazụ ebubo ịkpọta Egwu Eke?

N’ime Mazi Nnamdi Kehinde Kanu nakwa Ichie Emeka Ezebuiro, Nnukwu Onyeisi, obodo Afaraukwu – Ibeku onye kwuru na aka gọvanọ ahụ adịghị n’Egwu Eke, kedu onye na-ekwu eziokwu?

N’ezie, onye zọpụtara nne gị na nna gị tinyere ụmụnne gị hụrụ gị n’anya.

Kedụ uru Nnamdi Kehinde Kanu na-erite na mbibi ndị meere ya ihe ọma site na iji ihe ọjọọ kwụọ ha ụgwọ dịka Ikpeazu n’Ekweremadu?

Leave a Reply

Your email address will not be published.