APO 6:CSP OTHMAN BỤZI ỌKWỌ ỤGBỌALA GỌVANỌ EL-RUFAI

Spread the love

Kaduna: Ozi anyị nwetara bụ na CSP Othman Abdulsalam, onye uwe ojii ahụ bụ onye nlekọta(DPO) ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii dị na Garki, Abụja, onye aka ya dị n’ogbugbu ndị ahịa ndị Igbo mmadụ isii n’Apo, afọ iri n’anọ gara aga bụzị onyeisi ndị Ọkwọ ụgbọala Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna Steeti.

Aha mmadụ isii ahụ bụ Chinedu Meniru, Augustina Arebu, Ifeanyi Ozor, Anthony Nwokike, Paulinus Ogbonna nakwa Ekene Isaac Mgbe.

CSP Othman Abduldalam n’onwe ya tọgburu Augustina Arebu, nwa agbọghọ so ha, onye n’anwụbeghị ka a gbara ha egbe.

Ọ gbalagara ka okwu ahụ dasiwere ike n’ọchịchị Ọbasanjọ onye nyere ntụziaka maka ilebanye anya n’ogbugbu e gburu mmadụ isii ahụ ka ha si n’ụlọ egwu awantịlọ na-ala.

Nkea gosiri na Gọọmenti na-ekpuchi mmadụ abụọ aka ha dị n’ọchụ ahụ, bụ DCP onye e mezịrị AIG Ibrahim Danjuma, ndị Fulani. 

Danjuma, onye tiri iwu ogbugbu ọchụ ahụ, bụ onye Ọkaikpe Ishaq Bello, onye Fulani ibe ya, tọhapụrụ dịka onye ikpe amaghị ma bụrụkwa onye e weghachitere n’ọrụ ndị Uwe ojii ma bulikwaa ya n’ọkwa dịka AIG.

N’agbanyeghị arụ ọ kpara, Danjuma agaala ọzụzụ ndị welitere isi n’ụlọ mmụta Nigerian Institute for Policy and Strategic Studies (NIPPS), Kuru, Jos iji jikere maka mkpọlite n’ọkwa dị elu n’ọdịnihu.

E nwere ike, echi e mee ya onyeisi ndị Uwe Ojii Ala Naịjiriya.

El-Rufai bụ Mịnịsta na – ahụ maka isi obodo Naijiria oge Othman soro gbuo ọchụ ahụ. Oge ahụ ka ha abụọ malitere rụkọwa.

Gụkwuo:http://www.hoohaa.com.ng/2019/08/27/ndi-uwe-ojii-na-atohapu-ndi-nto-ndi-fulani-ma-ha-gosiputachaa-ha-huriwa/

Ruo taa, aha ya kaso na ndị ndị Uwe Ojii ka na-akwụ ụgwọ ọnwa.

“O nweghị mgbe ndị uwe ojii jiri chụọ ya n’ọrụ. Kama e zigara ya ngalaba nnyocha bụ CID, ebe ọ gaghị na-eyi uwe ndị Uwe ojii, iji zochie ya.

” Ugbua, ọ bụzị onyeisi ndị Ọkwọ ụgbọala Gọvanọ El-Rufai. O chere na o zulahụwo maka na o ji ugegbe anya ojii adọchi anya oge ọbụla.

DCP Ibrahim Danjuma, dịka ọkwa o ji oge ahụ gbadoro nwa agbọghọ ahụ bụ Augustina Arebu n’ụlọ egwu awantịlọ, onye gbara ya ‘boot’.

Ka ya na ndị otu ya na-alazị, Danjuma ziri ozi redio gwa ndị Uwe ojii nọ n’ihu ka ha kwụsị ha.

Ọ bịazịrị gbagbuo ha. Ndị Uwe Ojii ahụ burukwa ozu ha ga lie.

O gburu ọchụ n’ọchụ ga-ala, n’agbanyeghị afọ ole o were iji nweta ikpe nkwụmọtọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.