BOBRISKY; AJỌ NWA SI OWERE BAA NNE YA AFỌ

Spread the love

Legọs: Na mbido, Bobrisky bụ nwoke mana ugbua amaghịzị ihe ọ bụ abụ.

Nwatakịrị nwoke a jọrọ njọ aha ya bụ Idris Okuneye Olanrewaju a mụrụ n’afọ 1992 bidoro na nwata were rụwa ala.

Site n’ihe ya onwe ya kọrọ, ya bụ nwata nwanyị bụ ọdụdụ nwa n’ezinụlọ nwoke lụrụ nwanyị atọ bidoro n’oge mebie site n’ide uri n’ihu nakwa ime ka nwanyị oge ọ bụ nwata.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Kings College, Legọs nakwa Mahadum Legọs. Kaosiladi, akpịrị ego mere o jiri malite ọrụ akwụla nwoke ebe ndị Uwe ojii nọrọ kpọchie ya.

Kama ichegharị, mkpọchi ahụ mere o wuwezie ewu were katakwuo obi.

Nne na nna ya gụpụrụ ya bụ ‘ajọ nwa si owere baa nne ya afọ’ ka nwa ha mana ọ chọghị ịma. Kama, ọ hapụrụ Legọs kwalaa Abụja, ebe ọ malitere iji onwe ya mee ihe masịrị ya.

Njọ kazịrị ibe ya njọ oge Bobrisky gara mba Amerịka ewere waa ya ahụ iji nwezi ahụ nwanyị (Transgender).

Ọ sịrị na nne ya nna ya megidere ka ha kwụsị ya ajọ ndụ ahụ mana na ya nyịrị ha

“Nne m na nna m gbara mbọ ole ha nwere ike iji mee ka m kwụsị ime ka nwanyị mana ha chọpụtara na ọ bụghị ihe ha ga akwụsịnwu site n’aka ike nakwa iti m ihe.

O kwukwara na nne ya bụ onye ọ ka njọ n’isi mechara zite ndị akpụ obi ka ha tie ya ihe maka ọ sị na ya na-ebutere ezinụlọ ha mkparị.

Obi mechara gbawapụ nwanyị mmadụ, ọ nwụọ n’oge ya erughị eru.

“Nna m kpọrọ m ka na-achọ ịkwaga Abụja were gwa m na m abụghịkwa nwata, na m kwesịrị ijiri aka m mara udiri ndụ ga-abara m uru ibi.

Omeka nwanyị ahụ onye bụ nwa-afọ Ihe bụ-Igbo dị n’Ogun Steeti sịrị na ya bụ onye Alakụba mana ịga ụka Kraịst na-amasịkarị ya

“Anaghị m ekpesi Alakụba ike maka na ike ịsacha ihu (ablution) ugboro ise n’ụbọchị adịghị m ka m ghara ịna emebi uri ihu(makeup) m dere. N’ihi ya, ịga ụka Kraịst na-aka amasị m.

Ndị Uwe Ojii emekwaala ka ọhaneze mata na ha ejikerela ijide onye ọbụla mebiri iwu ala Naịjiriya site na ịnwe mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị, ịchịkọba ọgbakọ maka udiri ihe ahụ ma ọ bụkwanụ ịkwado ya n’ụzọ ọbụla.

Onye bụbu Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii mpaghara abụọ (Zone 2 Police Command), Oriakụ Dolapo Badmos, kwukwara sị “Ị bụrụ onye Omeka nwanyị, kwarapụọ na Naịjiriya. E nwere iwu (Iwu Mmachibido Akwamiko otu ahụ) nke mere ka inwe otu ma ọ bụ ọgbakọ ndị Omeka nwoke bụrụ arụ nke ntaramahụhụ ya bụ nga ihe ruru afọ iri n’ise.

Bobrisky, asampete nwoke ọma, lekwa gị lekwa nga.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.