IRI JI NZE N’ỌZỌ GBURUGBURU N’AMERỊKA

Spread the love

Amerịka: Ụbọchị Satọdee, abalị iri abụọ n’anọ nke ọnwa Ọgọọst ka otu Nze n’Ọzọ Gburugburu n’Amerịka nọrọ na Baltimore dị na steeti Meriland were chịkọba mmemme Iri Ji afọ 2019 maka ndị Igbo bi na mba Amerịka.

N’agbanyeghị na ihe a bịara bụ mmemme iri ji, ji dịzị ụkọ nke na enweghị onyonyoo ọbụla gosipụtara ndị na-eri ji n’ebe ahụ.

Kaosiladi, oke ụta agaghị adịịrị ha maka na anaghị akọ ji na mba Amerịka.

Otu ihe pụtara ìhè bụ na e ji asụsụ Igbo were mee ihe nile e mere ụbọchị ahụ.

Ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị isi ojii si mba ndị ọzọ nakwa ọcha ọnụ na-eru n’okwu bịara ya bụ mmemme nke nyere aka ịgosipụta omenala Igbo na mba ahụ.

N’okwu ya, Onyeisi otu Nze n’Ọzọ, USA bụ Nze Okechukwu Okigweh (Akajiugo) kelere ndị Igbo, ndị gbara mbọ si na steeti dị iche iche na mba Amerịka were bịa ya bụ mmemme.

O kwekwara nkwa na  nke afọ ọzọ ga-aka mma.

Ọ dị mma ka ndị Igbo bi na mba ofesi dị iche iche siri gaa n’ihu ime mmemme Iri Ji ha nke afọ a n’agbanyeghị mwakpo ndị IPOB wakporo onye bụbu Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadu tinyere nkatọ ha katọrọ mmemme iri ji na mba ofesi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.