MWAKPO NDỊ NAỊJIRIYA NA SAỤT AFRỊKA: SỊ BỌRỌ ỌBỌ – ỌJỊ ỤZỌ KALỤ

Spread the love

Abụja: Ka Sinetọ Ọjị Ụzọ Kalụ, Onye Nchịkwa(Chief Whip) Sineti Naịjiriya ka na-ekwu na ndị Naịjiriya kwesịrị ịbọrọ ọbọ maka mwakpo nakwa ogbugbu ndị Naịjiriya, ndị Naịjiriya amalitewo ịbọ ọbọ.

Ndị Naịjiriya iwe na-ewe wakporo ụlọ ọrụ MTN dị n’Apapa, Legọs munye ya ọkụ.

Igwe mmadụ iwe ji wakpokwara ụlọ ahịa Shoprite dị na Lekki, Legọs.

N’otu aka ahụ, Shoprite nọ n’Enugwu emepeghi taa maka ụjọ ndị Naịjirịa ịbọrọ ọbọ maka ihe e mere ndị Naịjiriya na Saụt Afrịka.

Dọkịnta Kalụ katọrọ akparamagwa ndị Saụt Afrịka ma kpọkuo ndị Naịjiriya ka ha kwudosie ike were bọrọ ọbọ karịa iche ebighị ebi ka Gọọmenti mba Saụt Afrịka jide ndị kpara arụ ahụ.

Kalu kwuru sị: “Kedụ ka mmadụ nwere ọgụgụ isi ga-esi kpọọ mmadụ ibe ya ọkụ sọọsọ maka na ọ gụrụ ya agụụ ime otu ahụ. O beghi na ịkpọchi ndị ekperime ahụ wakporo ndị Naịjiriya ma gbochie ha ire ahịa ha, ga kwesịrị ịta ahụhụ ya

Kalu jụrụ ihe mere a ga-eji na-awakpo ndị Naịjiriya bi Saụt Afrịka ma ndị Saụt Afrịka bi Naịjiriya bi n’udo.

O kwukwara sị, “Ọ bụrụ na Gọọmenti Saụt Afrịka achọghị ịchekwa ndị Naịjiriya bi be ha, e kwesịghị ịhapụ ka ha nọrọ ebea n’udo. Sị mechie ụlọ ọrụ ha nile n’obodo a tinyere MTN, DSTV, Shoprite  wdg.

Leave a Reply

Your email address will not be published.