#CHIDAVIDO 2020-AGBAMAKWỤKWỌ DAVIDO NA CHIỌMA

Spread the love

Davido ekwuola na ịgba nkwụ nakwa agbamakwụkwọ ya n’ọdị ya n’obi bụ Chiọma ga-abụ n’afọ ọzọ bụ 2020.

Odogwu a na-eti egwu ezigbo aha ya bụ David Adedeji Adeleke zipụrụ ozi n’amaozi Twitter ya ime ka ndị ọmasịrị (fans) ya maka nkea site na igosi onyonyoo ebe ndị be ya bịara be Chiọma ha maka Ịkụ aka.

Hmm, onye bụdị Chiọma? Kedụ ihe ọ kacha eme? Chiọma bụ nwa-afọ Owere, Imo Steeti. Ya na Devido zutere onwe ha na mahadum Babcock ebe Chiọma hapụrụ Agumakwụkwọ ya were gbasoro Devido. Nkea butere ya na ndị mụrụ ya okwu.

Otu ihe a ma maka Chiọma bụ na ọ bụ osi-ite. Ọ bụ ọkaibe na ìsì erimeri dị iche iche, ọ kacha nke Ndigbo nakwa ndị Yoroba. Ya bụ na ọ bụghị sọọsọ n’elu àkwà ka ọ dị mma. Mba, ọ dịkwazị mma n’ụsọ ekwu

Mana, onye ga-ata ya bụ ọmalincha nwa agbọghọ dị iri afọ abụọ n’anọ ụta? Ọ hụrụ ihe ka ubi were ree ọba. Ee, ọ hụla ‘ofe ka ọkwụrụ ụtọ’. Leenụ, ụgbọala Porsche SUV na-ada Nde Naira iri anọ n’ise bụ onyinye ncheta ọmụmụ odogwu Devido nyere ya afọ gara aga.

Ọzọkwa, Chiọma bụ onye o ji maka ya gụọ egwu nke ọ kpọrọ ‘Assurance’

Hmm, Ada Owere, unu dị egwu!

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.