N’ỌCHỊCHỊ APC, MWAKPO NDỊ OYIỌHAEGWU NDỊ FULANI KAZỊ NJỌ-POGU

Spread the love

Dọkịnta Bitrus Pogu, Onyeisi otu jikọtara ndị Obinetiti Naịjiriya bụ Middle Belt Forum, ekwuola na mwakpo ndị oyiọhaegwu (terrorists) ndị Fulani na-awakpo ndị obodo dịgasị na mpaghara Obinetiti Naịjiriya kazị njọ kemgbe otu ndọrọndọrọ APC batara n’ọchịchị. 

Pogu,n’okwu ya na ChannelsTV n’abalị Mọnde, sịrị na nsogbu ahụ bụ banyere ndị ọlụọ, ọlaa ndị Fulani ịwakpo ndị ọrụ ugbo.

“N’ọgbakọ Middle Belt Forum, anyị ekweteghi na ihe na-aga ugbua bụ ‘ọgụ ndị ọrụ ugbo na ndị nchị ehi’. Oge gara aga na Naịjiriya, ndị ọrụ ugbo na ndị nchị ehi na-alụ ọgụ maka imebi ugbo ha.

” Ugbua, a na-awakpozi ndị ọrụ ugbo n’enweghị esemokwu ọbụla, ndị mwakpo a anaghịkwa achị ehi abịa. Ha na-abịa dịka ndị agha – ndị oyiọhaegwu ndị Fulani,  were wakpo ndị ọrụ ugbo.

“Anyị hụtara tara ha ka ndị oyiọhaegwu, ndị bu otu ihe n’obi were bịa iyi ndị be anyị egwu:ịchụpụ anyị ma narakwa anyị ala anyị

Chetakwa na ọtụtụ ndịsonwere mpaghara ahụ dịka Ọchịagha Tiofilọs Danjuma laworo ezumike etiela mkpu ka ụwa nụ olu ha banyere atụmatụ mkpochapụ mba (Genocide) nke ha na-ebo ndị Fulani ebubo ya maka mwakpo ha na-awakpo ndị Obinetiti n’eleghi anya n’azụ. 

O kwukwara na Onyeisiala  Muhammadu Buhari ememinaghịzị Boko Haram ka o siri kwebuo na nkwa.

“Ọnọdụ nchekwa kazị njọ ugbua kemgbe APC weghara ọchịchị na 2015. Ugbua, ndị Boko Haram na-etiri sizi ndị soja anyị ma bunarakwa ha ngwa agha ha.

Nwoke ahụ bụ onye Chibok dị na Boronu Steeti kwukwara na Gọọmenti Etiti emebeghi ihe o kwesịrị ime iji gbapụta ụmụ agbọghọ Chibok ndị Boko Haram ka ji kemgbe afọ ole na ole.

Leave a Reply

Your email address will not be published.