MWAKPO ỊBỌRỌ ỌBỌ NA MTN, LEGỌS :NDỊ UWE OJII AGBAGBUOLA OTU ONYE

Spread the love

Legọs: Ndi Uwe Ojii agbagbuola otu onye n’ime ndị bịara ime gbagharị iwe n’ụlọ ọrụ Shoprite dị na Lekki, Legọs Steeti ụbọchị Tuuzdee.

Igwe mmadụ wakporo ụlọ ọrụ Shoprite ahụ ma mebisikwaa ngwa ahịa nọ n’ime ya iji bọrọ ọbọ maka mwakpo a na-awakpo ndị Naịjiriya na Saụt Afrịka
A gbagburu onye ajọ chi ahụ ka ndị ngagharị iwe ahụ mụnyere ụgbọala ndị Uwe Ojii ọkụ.

Ndị ngagharị iwe ahụ jiri iwe, gụrụ egwu agha were wuchie ebe ahụ.

Ndi Uwe Ojii ekweghị ha banye n’ime ụlọ ọrụ ahụ mana ha mụnyezịrị  ọkụ n’ezi.

Ha nọchịkwara ụzọ awara awara Lekki-Epe na-ekwo ekwo.

Kaosiladi, ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Balla Elkana,sịrị na o dobeghi anya ma mmadụ a nwụrụ na ya bụ ngagharị iwe.

“A gaghị m ekwunwu ma mmadụ a nwụrụ mana ihe m mma bụ na ndị ọrụ anyị gara ebe ahụ igbochi ọgbaghara”

Ọ katọkwara akparamagwa ndị ntorobịa ndị ahụ mere ngagharị iwe

“Anyị zigara ndị ọrụ anyị n’ìgwe n’ụlọ ọrụ nile ndị Saụt Afrịka nwe na steeti a, gụnyere MTN, Shoprite nakwa ndị ọzọ. 

Ka ọ dị ugbua, mba Afrịka dị iche iche na-eweso Saụt Afrịka iwe maka ya bụ ajọ akparamagwa iwakpo, bibie akụnụba ma gbukwaa ndị isi ojii ibe ha.

N’ihi ya, mba ndị dịka Naịjiriya, Rwanda na Malawi akagbuola isonye n’ọgbakọ akụnụba mba ụwa bụ World Economic Forum nke a na-eme na Capetown, Saụt Afrịka.

Leave a Reply

Your email address will not be published.