NSOGBU WAZIRI MUMININA, ONYEISI ALAKỤBA N’ALA YOROBA ARIWO ELU

Spread the love

Ibadan: Ọgbakọ ndị ụkọchukwu Alakụba na Mpaghara Ọdịda Anyanwụ bụ League of Imams and Alfas, South West Zone nọrọ ụbọchị Tọọzdee n’Ibadan were chie Ustaz Abdul-Lateef Adekilekun echichi dịka Wazirul (Muminina) nke Ala Yoroba. 

Nkea megidere ebumnobi Oluwo nke Iwo, Oba Abdulrasheed Akanbi, onye chọburu ichi Yaquob Abdul-Baki Mohammed ya bụ echichi Waziri Ala Yoroba.

Kaosiladi, Onyeisi otu ndị Imam nakwa Alfa na mpaghara Ọdida Anyanwụ ya na Edo na Delta Steeti, Sheikh Jamiu Bello, degaara Ọba ahụ akwụkwọ ozi gwa ya na echichi nke ya bụ onye eze ga-echi ga-ejedebe n’obodo ya bụ Iwo.

Okwu ahụ buteziri echichi imerime ndị Imam nakwa Alfa si Steeti asaa zukọrọ n’Ibadan were chie Adekilekun dịka Wazirul Muminina na mmemme kporo ekpo nke  otu National Board for Arabic and Islamic Studies in Nigeria(NBAIS) sonyere na ya. 

Odeakwụkwọ nhazi otu NBAIS,  Tajudeen Olaoti kọwara Adekilekun dịka “onye nkụzi Alakụba gụrụ akwụkwọ nke ọma, onye nkà edemede nakwa omeọgọ”

Kaọdịtaa, o nweghị onye ma uche onye e ji n’ala nke o ji enwe onye ma uche onye nya akpa asụ nri.

Ka a maranụ okwe ọzọ Oluwo nke Iwo ga-azụ maka na ihe a na-azo abụghị maka ikpe ekpere ma ọ bụ adịm asọ. Mbanụ! Ihe a na-azọ bụ onye ga-abụ ọnụ na-ekwuru ndị Alakụba n’ala Yoroba. Ya bụ, onye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ga na-ahụ ma ha chọọ ịzọ ọkwa. Ọ gwụla!

Leave a Reply

Your email address will not be published.