NTARAMAHỤHỤ KWESỊRỊ ỊDỊRỊ NDỊ GARA ỌGBAKỌ ‘WEF’ NA SAỤT AFRỊKA – AKPE ỌNWỤKA

Spread the love

Abụja: Otu na-ahụ maka ikike dịịrị mmadụ a na-akpọ Citizens Against Tyranny (CAT) akpọọla oku ka e nwee ntaramahụhụ ga-adịrị ụmụ amaala Naịjiriya nile gara ọgbakọ akụnụba mba ụwa bụ World Economic Forum (WEF) na Capetown, mba Saụt Afrịka.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ, Onyeisi oche otu ahụ bụ Nze Ugochukwu Akpe Ọnwụka sịrị na ihe ndị a mere gosiri na mwakpo nakwa ogbugbu a na-egbu ndị Naịjiriya na mba Saụt Afrịka nke mere Gọọmenti Naịjiriya jiri kagbuo ịga ọgbakọ ahụ emetụghị ha n’ahụ chaa chaa.

“Kedụ ka a ga-esi na-asụ ndị be anyị akwụ na Saụt Afrịka ndị a na-eme na ha bụ ọkachamara agbara gawa ọgbakọ akụnụba mba ụwa na mba ahụ?

O kwuru na nkea bụ nnupụisi nyere Gọọmenti Naịjiriya nke kagburu isonye na ya bụ ọgbakọ iji gosi iwe ya n’ebe Gọọmenti mba Saụt Afrịka nọ maka na o nweghị mbọ nwere isi ha na-agba ịkwụsị ya bụ arụ ndị be ha na-akpaso ndị isi ojii si mba ọzọ.

“Nkea bụ nnupụisi nyere Gọọmenti Naịjiriya ma na-egosikwa na ndị dị otu a abụghị ezigbo ụmụ amaala obodo anyị

” Ya bụ ọgbakọ akụnụba a kazị ndị a mkpa karịa Gọọmenti Etiti bụ ya ka okwu akụnụba nọ n’aka?

Ọtụtụ ndị akatọọla ajọ akparamagwa a. Otu n’ime bụ Mazị Femi Fani Kayode, (FFK) Nwa-afọ Naịjiriya okwu ya na-ada gbowam.

N’okwu nke ya, FFK kpọrọ oku ka e mee ndị ahụ ihe ndị IPOB mere Sinetọ Ike Ekweremadu bụbu Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya na Jamani.

Ndị a na-ekwu maka ha gụnyere Dọkịnta Ọbịageli Ezekwesịlị, Emịya Lamido Sanusi Lamido nke Kano, Gọvanọ Nasir El-Rufayị nke Kaduna nakwa Gọvanọ Kayode Fayemi nke Ekiti Steeti.

Kaosiladi, Mazị Jiofrị Onyeàmà, Mịnịsta okwu mba ọzọ ekwuola na ndị a enupughiri Gọọmenti Etiti isi n’ihi na ha anọrọlarịị na Saụt Afrịka tupu Gọọmenti Naịjiriya ekwuo na ya akagbuola ịbịa ya bụ ọgbakọ

Ihe agba n’aka, ejighị enyo ele ya. Ndị a ekwesịghịdị ịga ọgbakọ ahụ na mbụ iji gosi iwe ha maka mwakpo ndị Naịjiriya na mba ahụ.

Ọ bụrụgodị na ha amaghị ụma were bịa, ozigbo Gọọmenti obodo ha kara obi ka gbuo isonye, ha kwesịrị ịdọnyere Gọọmenti ha ukwu site na ịhapụ ọgbakọ ahụ ozigbo.

Leave a Reply

Your email address will not be published.