“UME UNU EZUGHỊ ỊMACHỊ NDỊ GỌVANỌ IME NJEM OFESI” ỤMAHỊ NA-AGWA IPOB

Spread the love

Abụja: Onyeisioche, ọgbakọ Ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma bụrụkwa Aka na-achị Ebọnyị Steeti, Omenka Dave Nweze Ụmahị ekwuola hoo!haa! na ume ndị otu IPOB ezughị ịmachi ha ime njem ofesi. 

Ụmahị, kwuru nkea ụnyahụ oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ka ya n’Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara ọgbakọ n’obi Gọọmenti Naịjiriya bụ Asọ Rock.

O kwukwara na o nweghị mgbaghara ọbụla ha ga-arịọ ndị IPOB maka na aka ha adịghị na  Mmachi a machiri otu ahụ.

“Anyị enweghị mgbaghara ọbụla anyị na-arịọ ha maka na ọ bụghị anyị machiri ha. Ee, anyị bụ ndị ndu ndị be anyị, ọ dịkwa mkpa na anyị katọrọ ihe ha na-eme.

” IPOB enweghị ikike imachi the Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ime njem”.

Chetakwa na onyeisi otu IPOB bụ Mazị Nnamdi Kehinde Kanụ gụnyere ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na ndị ha ga-awakpo ma a hụ ha na mba ofesi ọbụla.

Ọkaikpe otu IPOB, Mazị Aloy Ejimakọ nọkwa n’ime izu ụka a kwuo na ndị gọvanọ ahụ kwesịrị ịrịọ IPOB mgbaghara iji gosi mwute na Mmachi ọ sị na ha machiri IPOB.

Ugbua, ka a mazịara  n’ime mbe abụọ, nke bụ óke.

Leave a Reply

Your email address will not be published.