ENUGWU:EFCC ANWỤCHIKỌWO EZE NWANYỊ ‘MMM’

Spread the love

Enugwu: Ụlọ ọrụ na-ebuso iri ngarị agha bụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC, ngalaba Enugwu anwụchikọwo Princess Benny Chidimma, Onyenwe Ụlọ ọrụ Ponzi bụ “Millionaire African Leaders Club”, maka igwunahụ ndị mmadụ ego.

Aka kpaara Chidimma ka ọ gachara abalị abụọ e jidere onye nlekọta ngalaba Enugwu ya bụ Nwọnụ Priscilla Chika  n’ụlọ ọrụ ha dị na 79 Nike Road, Abakpa Nike, Enugwu.

Ndi ọrụ EFCC jidekwara ndị ọrụ ha mmadụ atọ ndị ọzọ n’oge ahụ.

Site n’ajụjụ ọnụ a gbara ya, Chidinma kwetara na ya bụ atụmatụ Ponzi ya bụ usoro igwunahụ ndị anya ukwu ego ha bụ nke a malitere dịka otu kwụụrụ onwe ya (NGO) na onye ha abụọ jikọrọ aka ahazi atụmatụ ahụ bụ otu nwoke bi n’ìgwè ọcha (Pọt Haakọt) aha ya bụ Ken Onyekwere Okwuikpo.

O kwuru na ha nwegasịrị ngalaba na Nsụka, Igwe ọcha, Aba, Abakaliki nakwa Enugwu.

O kwukwara na ha na-akwụ ndị wetara ego ọmụrụ nwa kwanarị iri asaa (70%) kwa afọ, na ọ bụghị kwanarị iri ise.

Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ EFCC, mpaghara Enugwu, Toni Orilade dọkwara ọhaneze aka ná ntị ka onye ọbụla kpachara anya maka ịdabara ndị ọsọ chi egbu a.

Ọ kwa onye mmiri hụrụ ụkwụ ya ka ọ na-eri. Ndị mmadụ achọbeghi ísi na MMM tinyekwara Ksley ‘Wonder Bank’ na Lets Partner with You were mụta ihe.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.