OWERE:ONYE AMỤMA ATỌRỌWO MA GBUO ONYE ỤKA YA

Spread the love

Owere: Ndi Uwe Ojii na-achụ ndị oji egbe ezu bụ Special Anti-Robbery Squad(SARS) nke Ụlọ ọrụ ndị Uwe  Imo Ojii, ngalaba Imo Steeti anwuchikọwo ótú onye amụma,  Maịkel Mbonu maka igbu Prinswịl Ezeji.

Kọmishọna ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Rabiu Ladodo,kwuru ụnyahụ n’Owere na ha jidekwara mmadụ anọ ndị ọzọ maka ọchụ nwa amadị ahụ.

O kwuru na e jidere onye amụma ahụ site na nnyocha ọgbara ọhụrụ nke ọchịagha ndị  SARS na steeti ahụ bụ Gọdfrị Viktọ nọ n’isi ya.

“N’abalị atọ nke ọnwa Ọgọọst, onye a loworo mmụọ zụtara ụgbọala Lexus were ga hụ onye amụma ya, Maịkel Mbọnụ.

” Site ụbọchị ahụ, ahụghịzị ya anya. Ezigbo enyi ya, Kịnslị Udemba bidoro kọwa na ihe mere Ezeji jiri fuo bụ maka na o gwụnahụrụ ya ego. Ndị mụrụ Ezeji nyere ya Puku Narị Naira iri itoolu n’iri isii (N960,000) ma ha ahapụghị nwa ha.

O mechara bụrụ na onye amụma ahụ so na-achọgharị Prinswịl bụ ihe gburu ya. Ka ndị Uwe ojii nyekwara ya mmekpa ahụ, o kwuziri na ọ bụ ya gburu nwa amadị ahụ. O du ndị Uwe ojii gazịrị gosi ndị Uwe Ojii ozu nwa amadị rewoworo ere dị. E nwetakwara ekwentị nakwa ụgbọala Prịnswịl tinyekwara Akwụkwọ Nsọ ya na ọtụmọkpọ n’aka onye amụma ahụ.

Ndị Uwe Ojii nwuchikọrọ mmadụ ise. Ha bụ Maịkel Mbọnụ,  27; onye amụma, Kịnslị Udemba, 24; Nwogu Anslem, 59; Blesịn Maịkel, 25 na Chidinma Godwin, 27.

Hmm,nkea bụkwa onye amụma ọgwụgwụ oge.

Leave a Reply

Your email address will not be published.